10 Mkpanaka eze agaghị esi na Juda pụọ,+ mkpara onye na-achị isi agaghịkwa esi n’agbata ụkwụ ya pụọ, ruo mgbe Shaịlo bịara;+ ọ bụkwa ya ka ndị dị iche iche ga-erubere isi.+
14 E wee nye ya ọchịchị+ na ùgwù+ na alaeze,+ ka ndị dị iche iche, mba dị iche iche na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi.+ Ọchịchị ya bụ ọchịchị na-adịru mgbe ebighị ebi nke na-agaghị agabiga agabiga, alaeze ya bụkwa nke a na-agaghị ebibi ebibi.+
14 M wee hụ, ma, lee! igwe ojii na-acha ọcha, na otu onye nke yiri nwa nke mmadụ+ nke nọ n’elu ígwé ojii ahụ, o kpukwa okpueze ọlaedo+ n’isi ya, mma owuwe ihe ubi nke dị nkọ dịkwa n’aka ya.