6 N’ihi na a mụworo anyị otu nwa,+ e nyewokwa anyị otu nwa nwoke;+ ịchịisi ga-adị n’ubu ya.+ A ga-akpọ ya Onye Ndụmọdụ Dị Ebube,+ Chineke nke bụ́ Dike,+ Nna Mgbe Ebighị Ebi,+ Onyeisi Udo.+
22 Nna m enyefewo ihe niile n’aka m,+ ọ dịghịkwa onye maara onye Ọkpara ahụ bụ ma e wezụga Nna+ ya; ọ dịghịkwa onye maara onye Nna ahụ bụ ma e wezụga Ọkpara+ ya nakwa onye Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.”