14M wee hụ, ma, lee! Nwa Atụrụ+ ahụ ka o guzo n’Ugwu Zayọn,+ ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ,+ bụ́ ndị e dere aha ya na aha Nna ya+ n’egedege ihu ha.
3 Ha na-abụkwa abụ+ nke dị ka ọ̀ bụ abụ ọhụrụ+ n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu ihe anọ ahụ dị ndụ+ na ndị okenye ahụ;+ ọ dịghịkwa onye nwere ike ịmụta abụ ahụ ma e wezụga otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ,+ bụ́ ndị e si n’ụwa zụta.+