34 “Mgbe ahụ, eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri ya, ‘Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi,+ ketanụ+ alaeze+ ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.+
16 “Enwekwara m atụrụ ọzọ,+ ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a;+ m ga-akpọtakwa ha, ha ga-ege ntị n’olu m,+ ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.+
17 Mmụọ nsọ+ na nwaanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ+ na-asị: “Bịa!” Onye ọ bụla nke nụrụ ya, ya sịkwa: “Bịa!”+ Onye ọ bụla nke akpịrị na-akpọ nkụ, ya bịakwa;+ onye ọ bụla nke chọrọ, ya nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.+