Abụ ọma Devid. Abụ olu ụtọ.
24 Ọ bụ Jehova nwe ụwa na ihe jupụtara n’ime ya,+
Elu ala nakwa ndị bi na ya.+
2 N’ihi na ọ tọsiwo ntọala ya ike n’elu oké osimiri,+
O mewokwa ka o guzosie ike n’elu osimiri.+
3 Ònye ga-arịgo n’ugwu Jehova,+
Ònyekwa ga-agbago n’ebe nsọ ya?+
4 Ọ bụ onye ọ bụla aka ya dị ọcha, onye obi ya dịkwa ọcha,+
Onye na-adịghị eji mkpụrụ obi M eme ihe efu,+
Onye na-adịghịkwa aṅụ iyi ụgha.+
5 Ọ ga-anata ngọzi n’aka Jehova,+
Natakwa ezi omume n’aka Chineke nke nzọpụta ya.+
6 Nke a bụ ọgbọ nke ndị na-achọ ya,
Nke ndị na-achọ ihu ọma gị, Chineke nke Jekọb.+ Sila.
7 “Welienụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ámá niile,+
Meenụ onwe unu ka unu dị elu, unu ọnụ ụzọ ndị dịwara kemgbe ogologo oge,+
Ka Eze dị ebube wee bata!”+
8 “Ònyezi bụ Eze a dị ebube?”+
“Ọ bụ Jehova bụ́ onye dị ike ma nwee ume,+
Jehova onye bụ́ dike n’agha.”+
9 “Welienụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ámá niile;+
Ee, welienụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ndị dịwara kemgbe ogologo oge,
Ka Eze dị ebube wee bata!”+
10 “Ònyezi bụ Eze a dị ebube?”
“Jehova nke ụsụụ ndị agha—ọ bụ ya bụ Eze ahụ dị ebube.”+ Sila.