Abụ Solomọn
8 “A sị nnọọ na ị dị ka nwanne m nwoke+ nke ṅụrụ ara nne m!+ Ọ bụrụ na mụ ahụ gị n’èzí, m ga-esusu gị ọnụ.+ Ndị mmadụ agaghịdị eleda m anya. 2 M ga-eduru gị, m ga-akpọbata gị n’ụlọ nne m,+ bụ́ onye na-ezibu m ihe. M ga-enye gị mmanya+ e tinyere ihe na-esi ísì ụtọ ka ị ṅụọ, bụ́ mmiri mkpụrụ pọmigranet a pịpụtara ọhụrụ. 3 M ga-ehiwe isi n’aka ekpe ya; ọ ga-ejikwa aka nri ya makụọ m.+
4 “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, emewo m ka unu ṅụọ iyi na unu agaghị akpọte ịhụnanya dị n’ime m ma ọ bụ kpalie ya ruo mgbe ọ chọrọ.”+
5 “Ònye bụ nwaanyị a+ nke si n’ala ịkpa+ na-abịa, nke dabeere n’ahụ́ onye ọ hụrụ n’anya?”+
“N’okpuru osisi apụl ka m kpọtere gị. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime gị mere nne gị. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ime mere nwaanyị mụrụ gị.+
6 “Kanye m dị ka akara n’elu obi gị,+ dị ka akara n’ogwe aka gị; n’ihi na ịhụnanya siri ike dị ka ọnwụ,+ ọ naghị ekwe ekwe dị ka Shiol, ọ na-achọsi ikwesị ntụkwasị obi+ ike. Ọ na-enwu dị ka ọkụ, bụ́ ire ọkụ nke Jaa.+ 7 Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,+ osimiri apụghịkwa ibupụ ya.+ Ọ bụrụ na mmadụ enye ihe niile dị oké ọnụ ahịa dị n’ụlọ ya iji nweta ịhụnanya, ndị mmadụ ga-eleghara ha anya.”
8 “Anyị nwere obere nwanne nwaanyị+ nke na-akpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwaanyị n’ụbọchị a ga-ekwu okwu ya?”
9 “Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,+ anyị ga-eji ọlaọcha rụọ ihe nrụbichi n’elu ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ ibo ụzọ,+ anyị ga-eji ibé osisi sida tụchie ya.”
10 “Abụ m mgbidi, ara m dịkwa ka ụlọ elu.+ N’ihi ya, n’anya ya, adị m ka nwaanyị nwetara udo.
11 “Ọ dị otu ubi vaịn+ Sọlọmọn nwere na Bel-hemọn. O nyefere ubi vaịn ahụ n’aka ndị ga-elekọta ya.+ Onye nke ọ bụla na-eweta otu puku mkpụrụ ego ọlaọcha maka ihe si na ya.
12 “Ubi vaịn m, nke bụ́ nke m, dị n’aka m. Sọlọmọn, i nwere otu puku, ndị na-elekọta ihe si na ya nwekwara narị abụọ.”
13 “Gị onye bi n’ubi a gbara ogige,+ ndị ibe gị na-aṅa ntị n’olu gị. Mee ka m nụ ya.”+
14 “Gbaa ọsọ, onye m hụrụ n’anya, mee ka ị dị ka nne mgbada ma ọ bụ dị ka nwa oké ele nke nọ n’ugwu ahịhịa na-esi ísì ụtọ juru.”+