5 Jehova kwukwara, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka e nwee eze, bụ́ onye ezi omume, nke ga-esi n’ezinụlọ* Devid.+ Ọ ga na-achị,+ na-egosi na ọ na-aghọta ihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, na-emekwa ezi omume n’ala a.+
9 Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị. Ọ bụ ya mere Chineke, bụ́ Chineke gị, ji tee gị mmanụ+ ma mee ka ị na-aṅụrị ọṅụ karịa ndị ibe gị.”+
11 Ahụrụ m ka e meghere eluigwe, hụkwa otu ịnyịnya ọcha+ dị ebe ahụ. A na-akpọkwa onye na-agba ya Onye E Kwesịrị Ịtụkwasị Obi+ na Onye Eziokwu.+ Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, na-alụkwa agha kwesịrị ekwesị.+