Ilu
31 Okwu Eze Lemuel, bụ́ okwu gbara ọkpụrụkpụ nne ya gwara ya mgbe ọ na-adụ ya ọdụ:+
2 Nwa m, gịnị ka m ga-agwa gị?
Nwa m buru n’afọ,
Nwa m ji maka ya kwee nkwa,+ gịnị ka m ga-agwa gị?
4 Lemuel, eze ekwesịghị ime ihe a,
Eze ekwesịghị ịṅụ mmanya,
Onye na-achị achị ekwesịghịkwa ịsị, “Olee ebe mmanya m dị?”+
5 Ka ọ ghara ịṅụ mmanya wee chefuo ihe iwu kwuru
Ma napụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ihe ruuru ha.
7 Ka ha ṅụọ mmanya wee chefuo na ha dara ogbenye;
Ka ha ghara icheta nsogbu ha ọzọ.
8 Kwuchitere onye ogbi ọnụ ya.
Gbachitere ndị niile nọ n’ọnụ ọnwụ.+
9 Kwuo okwu ma kpee ikpe ziri ezi.
Gbachitere* ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya.+
א [Alef]
10 Ònye ga-achọtali ezigbo nwaanyị?+
Ọ bara ezigbo uru karịa nkume kọral.*
ב [Bet]
11 Di ya tụkwasịrị ya obi,
E nweghịkwa ihe bara uru kọrọ di ya.
ג [Gimel]
12 Ná ndụ ya niile,
Ọ na-eji ihe ọma akwụ di ya ụgwọ, ọ bụghị ihe ọjọọ.
ד [Dalet]
13 Ọ na-achọta ajị anụ na ákwà linin.
Obi na-atọ ya ụtọ iji aka ya arụ ọrụ.+
ה [Hee]
14 Ọ dị ka ụgbọ mmiri nke onye na-azụ ahịa.+
Ọ na-esi n’ebe dị anya ebubata nri.
ו [Wọọ]
15 Ọ na-ebilikwa mgbe chi na-abọchabeghị
Kwadebere ndị ezinụlọ ya ihe ha ga-eri,
ז [Zayin]
16 Ọ na-eleru ala anya zụta ya.
Ọ na-eji ihe ọ rụtara* akụ ubi vaịn.
ח [Het]
ט [Tet]
18 Ọ na-achọpụta na ọ na-erite uru n’ahịa ọ na-azụ.
Ọkụ* ya anaghị anyụ n’abalị.
י [Yod]
כ [Kaf]
ל [Lamed]
21 Ọ naghị echegbu onwe ya maka ndị ezinụlọ ya n’oge oyi,
N’ihi na ndị ezinụlọ ya niile yi uwe e ji achụ oyi.*
מ [Mem]
22 Ọ na-eji aka ya akpa ákwà ọ na-agbasa n’elu ihe o ji edina ala.*
E ji ákwà linin na ajị anụ na-acha pọpụl kpaa uwe ya.
נ [Nun]
ס [Samek]
ע [Ayin]
25 O siri ike, a na-akwanyekwara ya ùgwù.
Ọ naghị atụ ụjọ ihe echi ga-abụ.
פ [Pee]
26 Okwu ya na-egosi na ọ ma ihe.+
Iwu obiọma na-achị ire ya.*
צ [Sadee]
ק [Kof]
28 Ụmụ ya na-ebili too ya.
Di ya na-ebili jaa ya mma.
ר [Resh]
29 E nwere ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị bụ́ ezigbo ụmụ nwaanyị,
Ma ị ka ha niile mma.
ש [Shin]
30 Mma nwere ike iduhie mmadụ, nwaanyị nwekwara ike ịma mma taa, echi mma ya alaa,+
Ma a ga na-aja nwaanyị nke na-atụ egwu Jehova mma.+
ת [Tọọ]