Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụ Ọgụgụ 23
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọnụ Ọgụgụ

      • Ihe mbụ Belam kwuru (1-12)

      • Ihe nke abụọ Belam kwuru (13-30)

Ọnụ Ọgụgụ 23:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:41

Ọnụ Ọgụgụ 23:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 23:13, 14, 28-30

Ọnụ Ọgụgụ 23:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:20

Ọnụ Ọgụgụ 23:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:35

Ọnụ Ọgụgụ 23:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 23:18; 24:3
  • +Je 10:22; Ọg 22:5; Di 23:3, 4
  • +Ọg 22:6

Ọnụ Ọgụgụ 23:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:12

Ọnụ Ọgụgụ 23:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 8:53
  • +Ọp 33:16

Ọnụ Ọgụgụ 23:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 13:14, 16; 22:17; Ọp 1:7

Ọnụ Ọgụgụ 23:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 24:10; Jos 24:10; Neh 13:1, 2

Ọnụ Ọgụgụ 23:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:38; 24:13

Ọnụ Ọgụgụ 23:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:11

Ọnụ Ọgụgụ 23:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 34:1
  • +Ọg 22:41; 23:1, 28, 29

Ọnụ Ọgụgụ 23:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:35; 23:5

Ọnụ Ọgụgụ 23:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 23:7; 24:3

Ọnụ Ọgụgụ 23:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “na-akwa ụta.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 89:35; Taị 1:2
  • +1Sa 15:29
  • +Aịz 14:24; 46:10; Maị 7:20

Ọnụ Ọgụgụ 23:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 12:1, 2; 22:15, 17; Ọg 22:12
  • +Ọg 22:18

Ọnụ Ọgụgụ 23:21

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “majik.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 13:21; 23:20; 29:45; Aịz 8:10

Ọnụ Ọgụgụ 23:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 20:2
  • +Ọg 24:8

Ọnụ Ọgụgụ 23:23

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Je 12:1, 3
  • +Ọg 22:7

Ọnụ Ọgụgụ 23:24

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 24:9

Ọnụ Ọgụgụ 23:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:38; 23:12

Ọnụ Ọgụgụ 23:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 23:13

Ọnụ Ọgụgụ 23:28

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    O nwere ike ịbụ, “ọzara; ala ịkpa.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 21:20

Ọnụ Ọgụgụ 23:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 22:41; 23:1, 14

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Ọnụ Ọgụ. 23:1Ọg 22:41
Ọnụ Ọgụ. 23:2Ọg 23:13, 14, 28-30
Ọnụ Ọgụ. 23:4Ọg 22:20
Ọnụ Ọgụ. 23:5Ọg 22:35
Ọnụ Ọgụ. 23:7Ọg 23:18; 24:3
Ọnụ Ọgụ. 23:7Je 10:22; Ọg 22:5; Di 23:3, 4
Ọnụ Ọgụ. 23:7Ọg 22:6
Ọnụ Ọgụ. 23:8Ọg 22:12
Ọnụ Ọgụ. 23:91Ez 8:53
Ọnụ Ọgụ. 23:9Ọp 33:16
Ọnụ Ọgụ. 23:10Je 13:14, 16; 22:17; Ọp 1:7
Ọnụ Ọgụ. 23:11Ọg 24:10; Jos 24:10; Neh 13:1, 2
Ọnụ Ọgụ. 23:12Ọg 22:38; 24:13
Ọnụ Ọgụ. 23:13Ọg 22:11
Ọnụ Ọgụ. 23:14Di 34:1
Ọnụ Ọgụ. 23:14Ọg 22:41; 23:1, 28, 29
Ọnụ Ọgụ. 23:16Ọg 22:35; 23:5
Ọnụ Ọgụ. 23:18Ọg 23:7; 24:3
Ọnụ Ọgụ. 23:19Ọm 89:35; Taị 1:2
Ọnụ Ọgụ. 23:191Sa 15:29
Ọnụ Ọgụ. 23:19Aịz 14:24; 46:10; Maị 7:20
Ọnụ Ọgụ. 23:20Je 12:1, 2; 22:15, 17; Ọg 22:12
Ọnụ Ọgụ. 23:20Ọg 22:18
Ọnụ Ọgụ. 23:21Ọp 13:21; 23:20; 29:45; Aịz 8:10
Ọnụ Ọgụ. 23:22Ọp 20:2
Ọnụ Ọgụ. 23:22Ọg 24:8
Ọnụ Ọgụ. 23:23Je 12:1, 3
Ọnụ Ọgụ. 23:23Ọg 22:7
Ọnụ Ọgụ. 23:24Ọg 24:9
Ọnụ Ọgụ. 23:26Ọg 22:38; 23:12
Ọnụ Ọgụ. 23:27Ọg 23:13
Ọnụ Ọgụ. 23:28Ọg 21:20
Ọnụ Ọgụ. 23:29Ọg 22:41; 23:1, 14
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
  • 30
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Ọnụ Ọgụgụ 23:1-30

Ọnụ Ọgụgụ

23 Belam wee gwa Belak, sị: “Rụọ ebe ịchụàjà asaa n’ebe a,+ kwadebekwara m oké ehi asaa na ebule asaa.” 2 Belak mere ihe Belam kwuru ozugbo. Belak na Belam wee chụọ otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.+ 3 Belam gwaziri Belak, sị: “Guzo n’akụkụ àjà a i suru ọkụ, ka m gawa. Ikekwe, Jehova ga-abịakwute m. M ga-agwa gị ihe ọ bụla o gosiri m.” O wee gbagoo n’ugwu.

4 Chineke bịakwutere Belam,+ Belam asị ya: “M kwadebere ebe ịchụàjà asaa ndị dị n’ahịrị, m chụkwara otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.” 5 Jehova mere ka Belam mata ihe ọ chọrọ ka o kwuo.+ Ọ sịrị ya: “Gaghachikwuru Belak. Ihe a ka ị ga-ekwu.” 6 O wee gaghachikwuru Belak ma hụ na ya na ndị isi Moab niile kwụ n’akụkụ àjà ahụ o suru ọkụ. 7 O wee kwuo, sị:+

“Belak eze Moab si n’Eram kpọta m.+

O si n’ugwu dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Ọ sịrị:

‘Bịa bụọrọ m Jekọb ọnụ.

Bịa kọchaa Izrel.’+

 8 Olee otú m ga-esi bụọ ndị Chineke na-abụghị ọnụ ọnụ?

Oleekwa otú m ga-esi kọchaa ndị Jehova na-akọchaghị?+

 9 M si n’elu oké nkume hụ ha,

M sikwa n’ugwu hụ ha.

Ha bi naanị ha n’ebe ahụ ka otu ndị.+

Ha ewereghị onwe ha na ha so ná mba ndị ọzọ.+

10 Ònye ga-agụtali ụmụ Jekọb ọnụ bụ́ ndị dị ọtụtụ ka ájá+

Ma ọ bụdị gụtalie otu ụzọ n’ụzọ anọ nke Izrel ọnụ?

Ka m* nwụọ ọnwụ ndị ezi omume,

Ka m nwụọkwa ka ha.”

11 Belak wee sị Belam: “Gịnị bụ ihe a i mere m? M kpọtara gị ebe a ka ị bụọ ndị iro m ọnụ, ma naanị ihe i mere bụ ịgọzi ha.”+ 12 Ọ zara, sị: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe ọ bụla Jehova mere ka m kwuo ka m ga-ekwu?”+

13 Belak sịrị ya: “Biko, soro m gaa ebe ọzọ ị ga-anọ hụ ha. Ị ga-ahụ naanị ụfọdụ n’ime ha. Ị gaghị ahụ ha niile. Si n’ebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”+ 14 O wee kpọrọ ya gaa n’ala Zofim, n’elu Pisga,+ ma rụọ ebe ịchụàjà asaa, chụọkwa otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.+ 15 Belam gwaziri Belak, sị: “Nọrọ n’ebe a n’akụkụ àjà a i suru ọkụ ka m gaa gwa Chineke okwu n’ebe ahụ.” 16 Jehova bịakwutere Belam ma mee ka ọ mata ihe ọ chọrọ ka o kwuo.+ Ọ sịrị: “Gaghachikwuru Belak. Ihe a ka ị ga-ekwu.” 17 Belam wee bịakwute Belak ma hụ na ọ nọ na-eche ya n’akụkụ àjà ahụ o suru ọkụ. Ndị isi Moab sokwa ya nọrọ n’ebe ahụ. Belak jụrụ ya, sị: “Gịnị ka Jehova kwuru?” 18 O wee kwuo, sị:+

“Belak, bilie gee ntị.

Nwa Zipọ, ṅaa m ntị.

19 Chineke abụghị mmadụ nkịtị nke na-agha ụgha.+

Ọ bụghịkwa nwa nke mmadụ nke na-agbanwe obi ya.*+

Ọ bụrụ na o kwuo ihe, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ya?

Ọ bụrụ na o kwuo okwu, ọ̀ bụ na ọ gaghị emezu ya?+

20 Lee, a kpọtara m ka m gọzie ha.

Ọ gọziela ha,+ agaghịkwa m agbanweli ya.+

21 Ọ naghị ekwe ka e nwee onye ga-eji ike anwansi* mee Jekọb ihe ọ bụla.

Ọ naghịkwa ekwe ka nsogbu ọ bụla bịara Izrel.

Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ha.+

Ha na-ekwusikwa ike na ọ bụ eze.

22 Chineke si n’Ijipt na-akpọpụta ha.+

Ọ bụụrụ ha mpi atụ́.+

23 N’ihi na e nweghị ihe ọjọọ ọ bụla a jụtara n’ase nke ga-ere n’isi Jekọb.+

E nweghị afa a ga-agba ga-eme Izrel ihe ọ bụla.+

E nwere ike ikwu ugbu a banyere Jekọb na Izrel, sị,

‘Lee nnukwu ihe Chineke mere!’

24 Ha bụ otu ndị nke ga-ebili ka ọdụm,

Ọ ga-amalikwa ka ọdụm.+

Ọ gaghị amakpuru ma ọ bụrụ na o ribeghị anụ o gbutere,

Ṅụọkwa ọbara ndị e gburu egbu.”

25 Belak sịziri Belam: “Ọ bụrụ na i nweghị ike ịbụ ha ọnụ, i kwesịghịnụ ịgọzi ha.” 26 Belam gwara Belak, sị: “Ọ̀ bụ na m gwaghị gị, sị, ‘M ga-eme ihe niile Jehova kwuru’?”+

27 Belak sịrị Belam: “Biko, bịa ka m kpọrọ gị gaa ebe ọzọ. Ikekwe, ọ ga-adị ezi Chineke mma ka ị nọrọ ebe ahụ bụọrọ m ha ọnụ.”+ 28 Belak wee kpọrọ Belam gaa n’elu Piọ, nke chere Jeshaịmọn* ihu.+ 29 Belam sịziri Belak: “Rụọ ebe ịchụàjà asaa n’ebe a, kwadebekwara m oké ehi asaa na ebule asaa.”+ 30 Belak mere ihe Belam kwuru. O wee chụọ otu oké ehi na otu ebule n’àjà n’ebe ịchụàjà nke ọ bụla.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya