Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 3
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • Ndị Izrel meriri Ọg Eze Beshan (1-7)

      • E kere ala dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jọdan (8-20)

      • A gwara Joshụa ka ọ ghara ịtụ egwu (21, 22)

      • Mosis agaghị abanye n’ala ahụ (23-29)

Diuterọnọmi 3:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 21:33-35

Diuterọnọmi 3:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 32:33; Di 29:7, 8; Jos 13:29, 30

Diuterọnọmi 3:6

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 27:29
  • +Le 18:25

Diuterọnọmi 3:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 32:33
  • +Jos 12:1, 2

Diuterọnọmi 3:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 21:33

Diuterọnọmi 3:11

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “igbe ozu.”

  • *

    Otu kubit bụ sentimita 44.5 (inch 17.5). Gụọ B14.

Diuterọnọmi 3:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 32:34
  • +Ọg 32:33

Diuterọnọmi 3:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 32:39; Jos 13:29-31; 1Ih 5:23

Diuterọnọmi 3:14

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Havọt-jeya pụtara “Obodo Jeya Ndị A Mara Ụlọikwuu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 2:22
  • +Di 3:4
  • +Jos 13:13
  • +Ọg 32:40, 41

Diuterọnọmi 3:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 32:39; Jos 17:1

Diuterọnọmi 3:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 32:33; Jos 22:9

Diuterọnọmi 3:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 34:11, 12

Diuterọnọmi 3:18

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ọ bụ ebo Ruben, Gad, na ọkara ebo Manase ka Mosis na-agwa.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 32:20-22

Diuterọnọmi 3:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Jos 1:14, 15; 22:4, 8

Diuterọnọmi 3:21

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 11:28; 14:30; 27:18
  • +Jos 10:25

Diuterọnọmi 3:22

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 14:14; 15:3; Di 1:30; 20:4; Jos 10:42

Diuterọnọmi 3:24

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “aka gị dị ike.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 15:16; Di 11:2
  • +Ọp 15:11; 2Sa 7:22; 1Ez 8:23; Ọm 86:8; Jer 10:6, 7

Diuterọnọmi 3:25

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 3:8; Di 1:7; 11:11, 12

Diuterọnọmi 3:26

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 20:12; 27:13, 14; Di 4:21; Ọm 106:32

Diuterọnọmi 3:27

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 27:12
  • +Di 34:1, 4

Diuterọnọmi 3:28

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 27:18-20; Di 1:38; 31:7
  • +Jos 1:1, 2

Diuterọnọmi 3:29

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:45, 46; 34:5, 6

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 3:1Ọg 21:33-35
Diut. 3:4Ọg 32:33; Di 29:7, 8; Jos 13:29, 30
Diut. 3:6Le 27:29
Diut. 3:6Le 18:25
Diut. 3:8Ọg 32:33
Diut. 3:8Jos 12:1, 2
Diut. 3:10Ọg 21:33
Diut. 3:12Ọg 32:34
Diut. 3:12Ọg 32:33
Diut. 3:13Ọg 32:39; Jos 13:29-31; 1Ih 5:23
Diut. 3:141Ih 2:22
Diut. 3:14Di 3:4
Diut. 3:14Jos 13:13
Diut. 3:14Ọg 32:40, 41
Diut. 3:15Ọg 32:39; Jos 17:1
Diut. 3:16Ọg 32:33; Jos 22:9
Diut. 3:17Ọg 34:11, 12
Diut. 3:18Ọg 32:20-22
Diut. 3:20Jos 1:14, 15; 22:4, 8
Diut. 3:21Ọg 11:28; 14:30; 27:18
Diut. 3:21Jos 10:25
Diut. 3:22Ọp 14:14; 15:3; Di 1:30; 20:4; Jos 10:42
Diut. 3:24Ọp 15:16; Di 11:2
Diut. 3:24Ọp 15:11; 2Sa 7:22; 1Ez 8:23; Ọm 86:8; Jer 10:6, 7
Diut. 3:25Ọp 3:8; Di 1:7; 11:11, 12
Diut. 3:26Ọg 20:12; 27:13, 14; Di 4:21; Ọm 106:32
Diut. 3:27Ọg 27:12
Diut. 3:27Di 34:1, 4
Diut. 3:28Ọg 27:18-20; Di 1:38; 31:7
Diut. 3:28Jos 1:1, 2
Diut. 3:29Di 4:45, 46; 34:5, 6
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
  • 21
  • 22
  • 23
  • 24
  • 25
  • 26
  • 27
  • 28
  • 29
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 3:1-29

Diuterọnọmi

3 “Anyị wee tụgharịa gbagowe n’Ụzọ E Si Aga Beshan. Ọg eze Beshan na ndị agha ya niile pụtara ịlụso anyị agha n’Edraị.+ 2 Jehova wee sị m, ‘Atụla ya egwu n’ihi na m ga-enyefe ya na ndị agha ya niile nakwa ala ya n’aka gị. Ị ga-eme ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọraịt, onye bibu na Heshbọn.’ 3 Jehova bụ́ Chineke anyị nyefekwara Eze Ọg onye na-achị Beshan n’aka anyị, ya na ndị agha ya niile. Anyị nọ na-egbu ha ruo mgbe a na-enweghịzi onye obodo ya fọrọ. 4 Anyị wee weghara obodo ya niile. E nweghị obodo anyị na-anapụghị ha. Anyị napụrụ ha obodo iri isii n’ógbè Agọb niile, ya bụ, alaeze Ọg nke dị n’obodo Beshan.+ 5 A rụsiri obodo ndị a niile anyị weghaara ike. Ha nwere mgbidi dị elu na ọnụ ụzọ àmà na ihe e ji atụchi ha, nweekwa ọtụtụ ime ime obodo. 6 Ma anyị bibiri ha+ otú anyị bibiri Eze Saịhọn onye chịrị Heshbọn. Anyị bibiri obodo ahụ niile, gbuokwa ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka.+ 7 Anyị wee chịkọrọ anụ ụlọ ha niile na ihe niile anyị kwatara n’obodo ndị ahụ.

8 “N’oge ahụ, anyị weghaara ala ndị eze abụọ bụ́ ndị Amọraịt,+ ndị nọ ná mpaghara Osimiri Jọdan, malite na Ndagwurugwu Anọn ruo n’Ugwu Hemọn+ 9 (ugwu ndị Saịdọn na-akpọbu Siriọn, ndị Amọraịt na-akpọbukwa ya Sina), 10 obodo niile ndị dị n’ala dị larịị, Gilied niile, na Beshan niile ruo Saleka na Edraị,+ bụ́ obodo ndị dị n’alaeze Ọg n’obodo Beshan. 11 N’ihi na ọ bụ Eze Ọg onye chịrị Beshan bụ onye ikpeazụ fọrọ ná ndị Refeyim. Ọ bụ ígwè ka e ji rụọ ihe e ji dọsa ozu* ya. Ọ ka dịkwa na Raba, bụ́ obodo ndị Amọn. Ọ dị kubit* itoolu n’ogologo, dịrịkwa kubit anọ n’obosara, ma e jiri ezigbo kubit tụọ ya. 12 N’oge ahụ, anyị weghaara ala a: malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ Ndagwurugwu Anọn, na ọkara ala Gilied bụ́ ugwu ugwu. M nyela ụmụ Ruben na ụmụ Gad+ obodo ya dị iche iche. 13 M nyekwala ọkara ebo Manase+ ebe fọrọ na Gilied nakwa Beshan niile bụ́ alaeze Ọg. A mabu ógbè Agọb niile, nke dị na Beshan, ka ala ndị Refeyim.

14 “Jeya+ nwa Manase weere ógbè Agọb niile+ ruo n’ókè ndị Geshọ na ndị Meaka.+ Ọ kpọkwara ime ime obodo ndị dị na Beshan aha ya, ya bụ, Havọt-jeya.*+ Ha na-aza aha ahụ ruo taa. 15 M nyela Mekia Gilied.+ 16 M nyekwala ụmụ Ruben na ụmụ Gad+ ala malite na Gilied ruo na Ndagwurugwu Anọn, (etiti ndagwurugwu ahụ bụ ókè ya) ruokwa Jabọk, ya bụ, ndagwurugwu nke bụ́ ókè ndị Amọn, 17 nakwa Araba na Osimiri Jọdan na ókè ya, malite na Kineret ruo n’Oké Osimiri Araba, ya bụ, Oké Osimiri Nnu, n’ala ala mkpọda Pisga n’akụkụ ebe ọwụwa anyanwụ.+

18 “M wee nye unu* iwu, sị: ‘Jehova bụ́ Chineke unu enyela unu ala a ka ọ bụrụ nke unu. Ndị dike unu niile ga-ejikere agha ma gafee n’ihu ụmụnne unu, bụ́ ndị Izrel.+ 19 Ọ bụ naanị ndị nwunye unu, ụmụ unu, na anụ ụlọ unu ga-anọrọ n’obodo ndị m nyere unu (o doro m anya na unu nwere ọtụtụ anụ ụlọ), 20 ruo mgbe Jehova ga-eme ka ụmụnne unu zuru ike, otú o meere unu, ha ebirikwa n’ala Jehova bụ́ Chineke unu ga-enye ha n’ofe Osimiri Jọdan. Mgbe ahụ, onye ọ bụla n’ime unu ga-alọghachi n’ebe o ketara ala n’ala m nyere unu.’+

21 “N’oge ahụ, m nyere Joshụa iwu a:+ ‘I jirila anya gị hụ ihe Jehova bụ́ Chineke unu mere eze abụọ ndị a. Jehova ga-eme alaeze niile unu ga-agafe otu ihe ahụ.+ 22 Unu atụla ha egwu n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-alụrụ unu agha.’+

23 “M rịọrọ Jehova n’oge ahụ, sị, 24 ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ị malitela ime ka ohu gị hụ na ị dị ebube, hụkwa na ị dị ike,*+ n’ihi na olee chi nọ n’eluigwe ma ọ bụ n’ụwa nke na-arụ ụdị nnukwu ọrụ ndị ị na-arụ?+ 25 Biko, ka m gafeenụ hụ ezigbo ala ahụ nke dị n’ofe Osimiri Jọdan, bụ́ ọmarịcha ebe a bụ́ ugwu ugwu nakwa Lebanọn.’+ 26 Ma Jehova ka nọ na-ewere m iwe n’ihi unu,+ o geghịkwa m ntị. Kama, Jehova sịrị m, ‘O zuolara gị! Agwakwala m okwu banyere ihe a ọzọ. 27 Gbagoo n’elu Pisga,+ lee anya n’ebe ọdịda anyanwụ na n’ebe ugwu na n’ebe ndịda nakwa n’ebe ọwụwa anyanwụ. Jiri anya gị hụrụ ala ahụ n’ihi na ị gaghị agafe Osimiri Jọdan a.+ 28 Mee Joshụa onye ndú,+ gbaa ya ume ma mee ka ọ dị ike, n’ihi na ọ bụ ya ga-ebutere ndị a ụzọ.+ Ọ bụkwa ya ga-eduru ha ka ha nweta ala ahụ ị ga-ahụ.’ 29 Ihe a niile mere mgbe anyị bi na ndagwurugwu nke dị n’ihu Bet-piọ.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya