Nehemaya
2 N’ọnwa Naịsan,* n’afọ nke iri abụọ+ n’ọchịchị Eze Atazaksis,+ a dọsara mmanya n’ihu ya. M wee buru mmanya ahụ otú m na-emebu bunye eze.+ Ma e nwetụbeghị mgbe m gbarụrụ ihu n’ihu ya. 2 Eze wee sị m: “Gịnị mere ihu gị ji gbarụọ agbarụọ n’agbanyeghị na e nweghị ọrịa ị na-arịa? Ọ ga-abụrịrị na obi adịghị gị mma.” Ezigbo egwu wee jide m.
3 M wee sị eze: “Eze, ị ga-adị ogologo ndụ. Gịnị mere ihu m agaghị agbarụ agbarụ ebe ọ bụ na e bibiri obodo m, bụ́ ebe e liri nna nna m hà, gbaakwa ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ?”+ 4 Eze sịziri m: “Gịnị ka ị chọrọ?” Ozugbo ahụ, m kpere ekpere gwa Chineke nke eluigwe okwu.+ 5 M wee sị eze: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ọ bụrụkwa na i nwere mmasị n’ebe ohu gị nọ, ziga m Juda, n’obodo ebe e liri nna nna m hà, ka m rụghachi ya.”+ 6 N’oge ahụ, nwunye eze nọ ọdụ n’akụkụ eze. Eze wee jụọ m, sị: “Olee mgbe ị ga-anọru? Oleekwa mgbe ị ga-alọta?” O wee masị eze ịhapụ m ka m gaa.+ M gwakwara ya oge ọ ga-abụ.+
7 M wee sị eze: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka e nye m akwụkwọ ozi ndị m ga-enye ndị gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis,*+ ka ha kwe ka m gafere ruo mgbe m ga-agaru Juda, 8 nakwa akwụkwọ ozi m ga-enye Esaf, onye na-elekọta ọhịa eze, ka o bunye m osisi ndị m ga-eji rụọ ọnụ ụzọ ámá Ebe A Rụsiri Ike+ n’Ụlọ Nsọ, rụọ mgbidi obodo ahụ,+ nakwa ụlọ m ga-ebi.” Eze wee nye m ha+ n’ihi na Chineke m nọnyeere m.+
9 M mechara bịakwute ndị gọvanọ ógbè dị n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Yufretis ma nye ha akwụkwọ ozi ndị ahụ eze nyere m. Eze kpọnyekwara m ndị ọchịagha na ndị na-agba ịnyịnya. 10 Mgbe Sanbalat+ onye Bet-horọn na Tobaya+ onye Amọn+ na-eje ozi nụrụ ya, obi jọrọ ha ezigbo njọ na e nwere onye bịara imere ndị Izrel ihe ọma.
11 M mechara bịarute Jeruselem, nọọ ụbọchị atọ. 12 M biliri n’abalị, mụ na ụmụ nwoke ole na ole. Agwaghị m onye ọ bụla ihe Chineke m tinyere m n’obi imere Jeruselem. E nweghị anụmanụ m ji ma e wepụ nke m nọ n’elu ya. 13 M wee si n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu+ pụọ n’abalị, si n’ihu Iyi Nnukwu Agwọ gaa n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ikpo Ntụ.*+ M leruru mgbidi Jeruselem a kwatusịrị akwatusị anya nakwa ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ repịara.+ 14 M gawara ruo n’Ọnụ Ụzọ Ámá Iyi,+ ruokwa n’Ọdọ Mmiri Eze, ma e nweghị ebe anụmanụ m nọ n’elu ya ga-esi gafere. 15 Ma m gbagowere na ndagwurugwu ahụ+ n’abalị ahụ, na-eleru mgbidi ahụ anya. M mechara laghachi azụ ma si n’Ọnụ Ụzọ Ámá Ndagwurugwu banye, lọtazie.
16 Ndị osote onye na-achị achị+ amaghị ebe m gara na ihe m nọ na-eme n’ihi na e nwebeghị ihe m gwara ndị Juu na ndị nchụàjà na ndị a ma ama na ndị osote onye na-achị achị, na ndị ọzọ ga-eso arụ ọrụ ahụ. 17 N’ikpeazụ, m sịrị ha: “Unu na-ahụ ọnọdụ ọjọọ anyị nọ na ya, otú e si bibie Jeruselem, gbaakwa ọnụ ụzọ ámá ya niile ọkụ. Bịanụ ka anyị rụghachi mgbidi Jeruselem, ka ihere a kwụsị ime anyị.” 18 M gwaziri ha otú Chineke m si nyere m aka+ nakwa ihe eze gwara m.+ Ha wee sị: “Ka anyị bilie rụọ ya.” Ha wee gbaa ibe ha ume* ịrụ ọrụ ọma ahụ.+
19 Mgbe Sanbalat onye Bet-horọn, Tobaya+ onye Amọn+ na-eje ozi, na Gishem onye Arebia+ nụrụ ya, ha malitere iji anyị eme ihe ọchị+ ma na-akparị anyị, sị: “Gịnịdị ka unu na-eme? Ùnu na-enupụrụ eze isi?”+ 20 Ma m zara ha, sị: “Ọ bụ Chineke nke eluigwe ga-eme ka ihe gaziere anyị.+ Anyị bụ́ ndị ohu ya ga-ebili rụọ mgbidi a. Ma e nweghị ihe jikọrọ unu na Jeruselem. Unu enweghịkwa òkè ma ọ bụ ihe a ga-eji cheta unu na ya.”+