Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 8
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Diuterọnọmi

      • E chetaara ndị Izrel ihe ọma Jehova meere ha (1-9)

        • “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ” (3)

      • Unu echefula Jehova (10-20)

Diuterọnọmi 8:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 3:1, 2
  • +Je 15:18

Diuterọnọmi 8:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 2:7
  • +Ọp 16:4; 20:20
  • +Di 13:3; Ilu 17:3

Diuterọnọmi 8:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 16:3
  • +Ọp 16:31; Ọm 78:24
  • +Mt 4:4

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    2/1/2004, p. 13-14

    8/15/1999, p. 25-26

    5/1/1994, p. 3

Diuterọnọmi 8:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 29:5; Neh 9:21

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    9/15/2004, p. 25-26

Diuterọnọmi 8:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ilu 3:12; 1Kọ 11:32; Hib 12:5-7; Mkp 3:19

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    5/1/1994, p. 3

Diuterọnọmi 8:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 3:8; Le 26:4; Di 11:11, 12

Diuterọnọmi 8:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 13:23
  • +Ezi 20:6

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    9/1/2011, p. 11-13

    6/15/2006, p. 16-17

    5/15/2000, p. 25, 27

Diuterọnọmi 8:9

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/1/2013, p. 12-13

Diuterọnọmi 8:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 6:10-12

Diuterọnọmi 8:11

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    1/1/2006, p. 28

    Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, p. 20

Diuterọnọmi 8:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ho 13:6

Diuterọnọmi 8:14

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “unu ekwela ka obi unu mee ka unu dị mpako.”

  • *

    Na Hibru, “n’ụlọ ndị ohu.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 9:4; 32:15
  • +Ọm 106:21

Diuterọnọmi 8:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 1:19; Jer 2:6
  • +Ọg 20:11

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    5/1/1992, p. 24

Diuterọnọmi 8:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọp 16:35
  • +Di 8:2
  • +Hib 12:11

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    8/15/1999, p. 25

Diuterọnọmi 8:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ho 12:8

Diuterọnọmi 8:18

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọm 127:1; Ho 2:8
  • +Di 7:12

Diuterọnọmi 8:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:25, 26; 30:17, 18; Jos 23:12, 13

Diuterọnọmi 8:20

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Da 9:11, 12

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Diut. 8:1Ilu 3:1, 2
Diut. 8:1Je 15:18
Diut. 8:2Di 2:7
Diut. 8:2Ọp 16:4; 20:20
Diut. 8:2Di 13:3; Ilu 17:3
Diut. 8:3Ọp 16:3
Diut. 8:3Ọp 16:31; Ọm 78:24
Diut. 8:3Mt 4:4
Diut. 8:4Di 29:5; Neh 9:21
Diut. 8:5Ilu 3:12; 1Kọ 11:32; Hib 12:5-7; Mkp 3:19
Diut. 8:7Ọp 3:8; Le 26:4; Di 11:11, 12
Diut. 8:8Ọg 13:23
Diut. 8:8Ezi 20:6
Diut. 8:10Di 6:10-12
Diut. 8:12Ho 13:6
Diut. 8:14Di 9:4; 32:15
Diut. 8:14Ọm 106:21
Diut. 8:15Di 1:19; Jer 2:6
Diut. 8:15Ọg 20:11
Diut. 8:16Ọp 16:35
Diut. 8:16Di 8:2
Diut. 8:16Hib 12:11
Diut. 8:17Ho 12:8
Diut. 8:18Ọm 127:1; Ho 2:8
Diut. 8:18Di 7:12
Diut. 8:19Di 4:25, 26; 30:17, 18; Jos 23:12, 13
Diut. 8:20Da 9:11, 12
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Diuterọnọmi 8:1-20

Diuterọnọmi

8 “Lezienụ anya ka unu na-edebe iwu niile m na-enye unu taa, ka unu wee dịrị ndụ+ ma mụbaa. Ka unu wee banye ma biri n’ala ahụ Jehova ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na ọ ga-enye ha.+ 2 Chetanụ ogologo ụzọ Jehova bụ́ Chineke unu mere ka unu gaa n’ala ịkpa n’ime afọ iri anọ a+ iji mee ka unu dị umeala n’obi na iji nwalee unu+ ka o wee mata ihe dị unu n’obi,+ ma ùnu ga-edebe ihe o nyere n’iwu ka ọ̀ bụ na unu agaghị edebe ya. 3 O mere ka unu dị umeala n’obi ma kwe ka agụụ gụọ unu.+ O nyekwara unu mana,+ bụ́ ihe unu na nna unu hà na-amabughị, ka o wee mee ka unu mara na ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile si n’ọnụ Jehova pụta.+ 4 Ákwà unu yi akaghị nká, ụkwụ unu azaghịkwa aza n’ime afọ iri anọ a.+ 5 O doro unu anya na ọ bụ otú mmadụ si adọ nwa ya aka ná ntị ka Jehova bụ́ Chineke unu si na-adọ unu aka ná ntị.+

6 “Na-edebenụ iwu Jehova bụ́ Chineke unu. Otú unu ga-esi eme ya bụ irubere ya isi na ịtụ egwu ya. 7 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-akpọbata unu n’ezigbo ala,+ ala iyi dị iche iche juru na ya, ebe isi mmiri dị iche iche na mmiri miri emi na-asọpụta n’ala dị larịị, na-asọpụtakwa n’ebe bụ́ ugwu ugwu, 8 ala ọka wit, ọka bali, mkpụrụ vaịn, mkpụrụ fig, pomigranet,+ mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ juru na ya,+ 9 ala nri na-agaghị akọ ụkọ na ya, nke a na-enweghịkwa ihe ga-akọ unu na ya, ala nke ígwè juru na nkume ndị dị na ya. Unu ga-egwutekwa ọla kọpa n’ugwu ndị dị na ya.

10 “Mgbe unu riri ihe rijuo afọ, unu ga-eto Jehova bụ́ Chineke unu maka ezigbo ala o nyere unu.+ 11 Kpacharanụ anya ka unu ghara ichefu Jehova bụ́ Chineke unu wee ghara idebe iwu ya, jụ iso ntụziaka ya, gharakwa ime ihe ndị o kpebiri ka unu na-eme, bụ́ ndị m na-enye unu n’iwu taa. 12 Mgbe unu riri ihe rijuo afọ, rụọ ọmarịcha ụlọ dị iche iche biri na ha,+ 13 mgbe ìgwè ehi unu na ìgwè ewu na atụrụ unu mụbara, mgbe unu nwere ọtụtụ ọlaọcha na ọlaedo, nwejuokwa ihe niile enwejuo, 14 unu adịla mpako*+ wee chefuo Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’Ijipt, n’ebe unu nọ na-agba ohu,*+ 15 onye mere ka unu gafere nnukwu ala ịkpa na-atụ ụjọ,+ bụ́ ebe e nwere agwọ ọjọọ na akpị, bụ́ ala kpọrọ nkụ nke na-enweghị mmiri ọ bụla. O mere ka mmiri si n’oké nkume siri ike gbapụta,+ 16 nyekwa unu mana unu riri+ n’ala ịkpa, bụ́ nke nna unu hà na-amaghị, iji mee ka unu dị umeala n’obi+ nakwa iji nwalee unu ka o wee meere unu ihe ọma n’ọdịnihu.+ 17 Ọ bụrụ na unu asị n’obi unu, ‘Ọ bụ ike anyị na ọkpụkpụ aka anyị ka anyị ji kpatara onwe anyị akụ̀ ndị a,’+ 18 chetanụ na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-enye unu ike unu ji akpata akụ̀,+ ka o wee mezuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu hà gbara, otú ọ na-eme taa.+

19 “Ọ bụrụ na unu anwaa anwaa chefuo Jehova bụ́ Chineke unu, wee soro chi ọzọ dị iche iche, fee ha ofufe, kpọọkwara ha isiala, ana m agwa unu taa na a ga-ebibirịrị unu.+ 20 Otú Jehova si na-ebibiri unu mba dị iche iche ka a ga-ebibi unu maka na unu egeghị ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke unu.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya