Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom
13 Ka onye* ọ bụla na-erubere ndị ọchịchị isi+ n’ihi na e nweghị ọchịchị ọ bụla ga-adị ma ọ bụrụ na Chineke ekweghị ka ọ dịrị.+ Ọ bụ Chineke dowere ọchịchị ndị dị adị ka ha nọrọ n’okpuru ya.+ 2 N’ihi ya, onye ọ bụla na-emegide ndị ọchịchị na-agba ihe Chineke haziri ụkwụ; ndị na-emegide ha na-ewetara onwe ha ikpe ọmụma. 3 N’ihi na a na-atụ ndị na-achị achị egwu, ma ọ bụghị ndị na-eme ihe ọma na-atụ ha egwu, kama ọ bụ ndị na-eme ihe ọjọọ.+ Ị̀ chọrọ ka ị ghara ịna-atụ ndị ọchịchị egwu? Mewe ihe ọma,+ ha ga-ajakwa gị mma. 4 N’ihi na ha bụ ndị na-ejere Chineke ozi ka ihe wee gaziere gị. Ma ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu n’ihi na ha anaghị ebu mma agha na nkịtị. Ha bụ ndị na-ejere Chineke ozi, ndị na-ata ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.
5 N’ihi ya, e nwere ezigbo ihe mere unu ga-eji na-erubere ha isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ ha na-ata ndị mmadụ, kamakwa maka akọnuche unu.+ 6 Ọ bụ ya mere unu jikwa na-atụ ụtụ isi; n’ihi na ha bụ ndị ozi Chineke, ndị na-ejere ọhaneze ozi a mgbe niile. 7 Na-enyenụ mmadụ niile ihe ruuru ha: onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ isi, tụọrọnụ ya ụtụ isi;+ onye e kwesịrị ịtụrụ ụtụ ahịa, tụọrọnụ ya ụtụ ahịa; onye e kwesịrị ịtụ egwu, tụọnụ ya egwu;+ onye e kwesịrị ịsọpụrụ, sọpụrụnụ ya.+
8 Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ihe ọ bụla, ma e wepụ ịhụ ibe unu n’anya;+ n’ihi na onye hụrụ mmadụ ibe ya n’anya emezuola ihe iwu kwuru.+ 9 N’ihi na e dere n’iwu, sị, “Akwala iko,+ egbula mmadụ,*+ ezula ohi,+ enwela anyaukwu.”+ A chịkọtara iwu ndị a na iwu ọ bụla ọzọ n’otu iwu, ya bụ, “Hụ onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.”+ 10 Onye hụrụ ndị ọzọ n’anya anaghị eme onye agbata obi ya ihe ọjọọ;+ n’ihi ya, onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-emezu ihe iwu kwuru.+
11 Na-emekwanụ ihe ndị a m kwuru n’ihi na unu ma na ihe a bụ oge unu kwesịrị iteta n’ụra+ maka na nzọpụta anyị dị nso ugbu a karịa mgbe anyị malitere inwe okwukwe na Jizọs. 12 Chi ejimiela; chi abọwala. N’ihi ya, ka anyị ghara ịrụ ọrụ ọ bụla gbasara ọchịchịrị,+ kama ka anyị yiri ngwá agha nke ìhè.+ 13 Otú ahụ ndị mmadụ na-eme n’ehihie mgbe onye ọ bụla na-ahụ ibe ya, ka anyị na-akpa àgwà kwesịrị ekwesị,+ ghara iso na-eri oriri oké mkpọtụ na ịna-aṅụ oké mmanya, ghara inwe mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị na ime ihe ọjọọ n’asọghị anya,*+ gharakwa ịna-ese okwu na ịna-ekwo ekworo.+ 14 Kama yirinụ Onyenwe anyị Jizọs Kraịst ka uwe.*+ Unu anọkwala na-eche otú unu ga-esi eme ihe na-agụ ahụ́ unu agụụ.+