Ilu
2 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata ihe m na-ekwu
Ma jiri iwu m na-enye gị kpọrọ ihe,+
2 I wee gee ntị ka ị mara ihe+
Ma meghee obi gị ka ị na-aghọta ihe;+
3 Ọ bụrụkwa na ị rịọ arịrịọ ka ị ghọta ihe+
Ma rịọsie arịrịọ ike ka ihe wee doo gị anya;+
4 Ọ bụrụ na ị na-achọ ya otú e si achọ ọlaọcha,+
Na-achọkwa ya otú e si achọ akụ̀ zoro ezo;+
5 Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ihe ịtụ egwu Jehova pụtara,+
Ị ga-amụtakwa banyere Chineke.+
6 N’ihi na ọ bụ Jehova na-eme ka mmadụ mara ihe.+
Ọ bụ okwu si n’ọnụ ya na-eme ka mmadụ mụta ihe ma ghọta ihe.
7 Ọ na-eme ka ndị ezi omume nwee ezigbo amamihe.
Ọ bụụrụ ndị kwụsiri ike n’ebe ọ nọ ọta.+
9 Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ihe bụ́ ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ,
Ya bụ, ihe niile dị mma mmadụ kwesịrị ịna-eme.+
10 Mgbe amamihe banyere gị n’obi,+
Ịmụta ihe ana-atọkwa gị* ụtọ,+
11 Ichebara ihe echiche nke ọma ga-eche gị nche,+
Ịghọta ihe ga-echebekwa gị.
12 Ọ ga-echebe gị ka ị ghara ịbanye n’ụzọ ọjọọ,
Ka ị ghara ịdaba n’aka onye na-ekwu ihe rụrụ arụ,+
13 Ka ị ghara ịdaba n’aka ndị na-ahapụ ezigbo ụzọ
Gawa n’ụzọ gbara ọchịchịrị,+
14 Ka ị ghara ịdaba n’aka ndị ime ihe ọjọọ na-atọ ụtọ,
Ndị ịrụ arụrụala na-eme obi ụtọ,
15 Ndị ụzọ ha gbagọrọ agbagọ,
Ndị na-aghọkwa aghụghọ n’ihe niile ha na-eme.
16 Ọ ga-echebe gị ka ị ghara ịdaba n’aka nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ,*
N’aka nwaanyị na-akwa iko* nke na-eji ire ụtọ arata mmadụ,+
17 Bụ́ nwaanyị na-ahapụ enyi ọma* o nwere kemgbe ọ bụ agbọghọ,+
Na-echefukwa ndụ ya na Chineke gbara.
19 E nweghị onye ọ bụla n’ime ndị ya na ha na-enwe mmekọahụ ga-alọta,
Ha agaghịkwa abịaghachi n’ụzọ na-eduga ná ndụ.+