Maịka
A ga-ebulikwa ya ka ọ dị elu karịa ugwu nta niile.
Ndị dị iche iche ga-enurukwa na-agbago na ya.+
2 Ọtụtụ mba ga-ejekwa, sị:
“Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova,
Gbagookwa n’ụlọ Chineke Jekọb.+
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya.
Anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.”
N’ihi na a ga-esi na Zayọn nye iwu,*
Sikwa na Jeruselem kwuo ihe Jehova kwuru.
Ha ga-akpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè,
Kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma e ji akwa osisi.+
Mba agaghị eweli mma agha lụso mba ọzọ agha.
Ha agaghịkwa amụ otú e si alụ agha.+
4 Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya.+
5 N’ihi na ndị dị iche iche ga na-aza aha* chi ha.
Ma, anyịnwa ga na-aza aha* Jehova bụ́ Chineke anyị+ ruo mgbe niile ebighị ebi.
6 Jehova kwuru, sị: “N’ụbọchị ahụ,
M ga-achịkọta ndị na-ete ụkwụ.
M ga-akpọkọta ndị a chụsasịrị achụsasị,+
Kpọkọtakwa ndị m mesiri ike.
Mụnwa bụ́ Jehova ga-esikwa n’Ugwu Zayọn na-achị ha,
Malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi.
8 Ma gịnwa, ụlọ nche nke ndị na-azụ atụrụ,
Ugwu Zayọn,+
Ị ga-amaliteghachi ịchị n’alaeze mbụ,+
Alaeze nke dịbu na Jeruselem.+
9 Gịnịzi mere i ji na-etisi mkpu ike?
Ọ̀ bụ na i nweghị eze,
Ka ọ̀ bụ na onye ndụmọdụ gị anwụọla,
Nke mere ahụ́ ji na-afụ gị ụfụ dị ka nwaanyị ime na-eme?+
10 Ndị bi na Zayọn, ahụ́ ga-afụ unu ụfụ, unu ga-etikwa mkpu ákwá
Dị ka nwaanyị ime na-eme,
N’ihi na unu ga-esi n’obodo pụọ gaa biri n’ọhịa.
Unu ga-erukwa Babịlọn.+
Ọ bụ ebe ahụ ka a ga-anapụta unu.+
Ọ bụ ebe ahụ ka Jehova ga-agbapụta unu n’aka ndị iro unu.+
11 A ga-achịkọta ọtụtụ mba ịlụso unu agha,
Ha ga-asị, ‘Ka e merụọ Zayọn,
Ka anya anyị hụkwa mgbe ihe a ga-eme ya.’
12 Ma, ha amaghị uche Jehova.
Ha aghọtaghịkwa nzube ya.
N’ihi na ọ ga-achịkọta ha dị ka ùkwù ọka* a ka gbutere egbute, nke e bu na-aga n’ebe a na-azọcha ọka.
M ga-agbanwekwa ọbụ ụkwụ unu ka ọ bụrụ ọla kọpa.
Unu ga-egwerikwa ọtụtụ ndị.+
Unu ga-enye Jehova uru ha ji aghụghọ rite,
Nyekwa Onyenwe ụwa niile akụ̀ ha.”+