Aịzaya
11 Úkwù osisi Jesi+ ga-epu ome.+
Ome+ nke si na mgbọrọgwụ ya pulite ga-amịkwa mkpụrụ.
2 Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya.*+
Ọ bụ ya mere ọ ga-eji mara ihe,+ na-aghọtakwa ihe nke ọma,
Na-enye ezigbo ndụmọdụ, dịkwa ike,+
Mara ọtụtụ ihe gbasara Jehova, na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù.
3 Ịkwanyere Jehova ezigbo ùgwù ga na-atọ ya ụtọ.+
Ọ gaghị eji naanị ihe anya ya hụrụ ekpe ikpe.
Ọ gaghịkwa eji naanị ihe ọ nụrụ adọ mmadụ aka ná ntị.+
4 Ọ ga na-ekpere ndị ogbenye ikpe ziri ezi.
Ọ ga-eji maka ndị dị umeala n’obi n’ụwa dọọ ndị mmadụ aka ná ntị otú kwesịrị ekwesị.
5 Ezi omume ga-adị ka ájị̀ ọ na-eke n’úkwù.
Irubere Chineke isi ga-adịkwa ka ájị̀ ọ na-eke n’ume.+
6 Anụ ọhịa wolf* na nwa atụrụ ga-anọkọ n’udo.+
Agụ owuru na nwa ewu ga-amakpukọkwa.
Nwa ehi na ọdụm na anụ gbara agba ga-anọkọkwa.*+
Nwatakịrị ga na-edukwa ha.
7 Nne ehi na anụ ọhịa bea ga-atakọ ahịhịa.
Ụmụ ha ga-amakpukọkwa.
Ọdụm ga-ata okporo ọka dị ka ehi.+
8 Nwa na-aṅụ ara ga-egwuri egwu n’ọnụ agwọ ubí nọ,
Nwatakịrị a kwụsịrị ara ga-atụkwasịkwa aka ya n’ọnụ agwọ ọjọọ nọ.
9 Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́,+
Ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m niile,+
N’ihi na amamihe gbasara Jehova ga-ejupụta ụwa
Otú mmiri si ejupụta oké osimiri.+
10 N’oge ahụ, mgbọrọgwụ Jesi+ ga-eguzo ọtọ bụrụ ihe na-agbara ndị dị iche iche àmà.+
Mba dị iche iche ga-agakwuru ya ka o duzie ha.*+
Ebe ọ na-anọ ezu ike ga-adịkwa ebube.
11 N’oge ahụ, Jehova ga-eji aka ya kpọkọta ndị ya nke ugboro abụọ, ya bụ, ndị ya fọrọ n’Asiria,+ n’Ijipt,+ na Patrọs,+ na Kush,*+ n’Ịlam,+ na Shaịna,* na Hemat, nakwa n’agwaetiti oké osimiri.+ 12 Ọ ga-edowe ihe ga-agbara mba niile àmà, kpọkọta ndị Izrel a chụsara achụsa,+ sikwa n’ebe niile n’ụwa* kpọkọta ndị Juda a chụsara achụsa.+
13 Ifrem ga-akwụsị anyaụfụ ọ na-eme.+
A ga-ebibikwa ndị na-ewesa Juda iwe.
Ifrem agaghị na-emere Juda anyaụfụ.
Juda agaghịkwa na-ewesa Ifrem iwe.+
14 Ha ga-eji ọsọ gaa ná mkpọda obodo ndị Filistia n’ebe ọdịda anyanwụ.
Ha ga-agbakọ aka bukọrọ ihe ndị Ọwụwa Anyanwụ.
Ha ga-emeri ndị Ịdọm+ na ndị Moab.+
Ha ga na-achịkwa ndị Amọn.+
15 Jehova ga-ekewa oké osimiri Ijipt.*+
Ọ ga-atụkwa Osimiri Yufretis aka.+
Ọ ga-ejikwa ume* ya na-ekpo ọkụ mee ka iyi asaa ndị na-asọnye n’osimiri ahụ taa.
Ọ ga-emekwa ka ndị mmadụ yiri akpụkpọ ụkwụ ha gafee ya.