Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 1 Ihe E Mere 22
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ

      • Ihe ndị Devid kwakọtara a ga-eji arụ ụlọ nsọ Chineke (1-5)

      • Devid gwara Solomọn ka ọ rụọrọ Chineke ụlọ (6-16)

      • Devid gwara ndị isi Izrel ka ha nyere Solomọn aka (17-19)

1 Ihe E Mere 22:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 12:5, 6; 2Sa 24:18; 2Ih 3:1

1 Ihe E Mere 22:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 9:20, 21; 2Ih 2:17, 18
  • +1Ez 5:15, 17; 6:7; 7:9

1 Ihe E Mere 22:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 7:47

1 Ihe E Mere 22:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 5:6, 8
  • +2Ih 2:3
  • +2Sa 5:11

1 Ihe E Mere 22:5

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “isi akabeghịkwa ya.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 3:7
  • +2Ih 2:5
  • +Hag 2:3
  • +Ọm 68:29

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ),

    1/2017, p. 29

1 Ihe E Mere 22:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 12:5, 6; 2Sa 7:2; Ọm 132:3-5

1 Ihe E Mere 22:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “Ị wụfuola nnukwu ọbara.”

  • *

    Na Hibru, “ị wụfuola nnukwu ọbara.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 17:4

1 Ihe E Mere 22:9

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “ga-enwe ezumike.”

  • *

    Aha a bụ́ Solomọn si n’okwu Hibru pụtara “Udo.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 28:5
  • +2Sa 7:12, 13; 1Ez 4:25; 5:4
  • +2Sa 12:24
  • +Ọm 72:7

1 Ihe E Mere 22:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 5:5
  • +2Sa 7:14; Hib 1:5
  • +1Ih 17:12-14; Ọm 89:35, 36

1 Ihe E Mere 22:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 28:20

1 Ihe E Mere 22:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 1:10; Ọm 72:1
  • +Di 4:6

1 Ihe E Mere 22:13

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Le 19:37; 1Ih 28:7
  • +Di 12:1; 17:18, 19; Jos 1:8; 1Ez 2:3; 1Ih 28:7; Ọm 19:8, 11
  • +Jos 1:6, 9; 1Ih 28:20

1 Ihe E Mere 22:14

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Otu talent bụ kilogram 34.2. Gụọ B14.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 29:6, 7
  • +1Ih 29:2-4

1 Ihe E Mere 22:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 5:17; 6:7; 7:9
  • +1Ez 7:13, 14

1 Ihe E Mere 22:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ih 22:3
  • +2Ih 1:1

1 Ihe E Mere 22:19

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Gụọ Nkọwa Okwu.

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 4:29; 2Ih 20:3; Da 9:3
  • +1Ez 6:1
  • +1Ez 8:6, 21
  • +Di 12:21; 1Ez 8:29; 9:3

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

1 Ihe 22:1Di 12:5, 6; 2Sa 24:18; 2Ih 3:1
1 Ihe 22:21Ez 9:20, 21; 2Ih 2:17, 18
1 Ihe 22:21Ez 5:15, 17; 6:7; 7:9
1 Ihe 22:31Ez 7:47
1 Ihe 22:41Ez 5:6, 8
1 Ihe 22:42Ih 2:3
1 Ihe 22:42Sa 5:11
1 Ihe 22:51Ez 3:7
1 Ihe 22:52Ih 2:5
1 Ihe 22:5Hag 2:3
1 Ihe 22:5Ọm 68:29
1 Ihe 22:7Di 12:5, 6; 2Sa 7:2; Ọm 132:3-5
1 Ihe 22:81Ih 17:4
1 Ihe 22:91Ih 28:5
1 Ihe 22:92Sa 7:12, 13; 1Ez 4:25; 5:4
1 Ihe 22:92Sa 12:24
1 Ihe 22:9Ọm 72:7
1 Ihe 22:101Ez 5:5
1 Ihe 22:102Sa 7:14; Hib 1:5
1 Ihe 22:101Ih 17:12-14; Ọm 89:35, 36
1 Ihe 22:111Ih 28:20
1 Ihe 22:122Ih 1:10; Ọm 72:1
1 Ihe 22:12Di 4:6
1 Ihe 22:13Le 19:37; 1Ih 28:7
1 Ihe 22:13Di 12:1; 17:18, 19; Jos 1:8; 1Ez 2:3; 1Ih 28:7; Ọm 19:8, 11
1 Ihe 22:13Jos 1:6, 9; 1Ih 28:20
1 Ihe 22:141Ih 29:6, 7
1 Ihe 22:141Ih 29:2-4
1 Ihe 22:151Ez 5:17; 6:7; 7:9
1 Ihe 22:151Ez 7:13, 14
1 Ihe 22:161Ih 22:3
1 Ihe 22:162Ih 1:1
1 Ihe 22:19Di 4:29; 2Ih 20:3; Da 9:3
1 Ihe 22:191Ez 6:1
1 Ihe 22:191Ez 8:6, 21
1 Ihe 22:19Di 12:21; 1Ez 8:29; 9:3
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
1 Ihe E Mere 22:1-19

Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ

22 Devid wee sị: “Ebe a ka a ga-arụrụ Jehova bụ́ ezi Chineke ụlọ. Ọ ga-abụkwa ebe ịchụàjà ndị Izrel ga-anọ na-achụ àjà a na-esu ọkụ.”+

2 Devid kwukwara ka a kpọkọta ndị mbịarambịa+ bi n’Izrel. Mgbe a kpọkọtara ha, ya agwa ha ka ha na-awa nkume, na-awapụtakwa ndị nke ga-adị mma iji rụọrọ ezi Chineke ụlọ.+ 3 Devid kwakọtakwara ọtụtụ ígwè a ga-eji mere ntu a ga-eji kụọ ibo ọnụ ụzọ ámá dị iche iche nakwa ihe a ga-eji akpagide otu ihe na ibe ya. Ọ kwakọtakwara ọtụtụ ọla kọpa nke na a tụlighị otú ọ hà atụ̀.+ 4 Ndị Saịdọn+ na ndị Taya+ butekwaara Devid osisi sida+ karịrị akarị, nke na a gụtalighị osisi sida ndị ahụ ọnụ. 5 Devid sịkwara: “Solomọn nwa m bụ obere nwa, o nwebeghịkwa ihe ọ ma.*+ Ma ụlọ a ga-arụrụ Jehova ga-adị ebube, maakwa+ mma na-enweghị atụ,+ nke na akụkọ ya ga-agbasaru ebe niile.+ N’ihi ya, m ga-akwakọtara ya ihe.” Ọ bụ ya mere tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ọtụtụ ihe a ga-eji rụọ ụlọ ahụ.

6 Devid kpọkwara Solomọn nwa ya, gwa ya ka ọ rụọrọ Jehova bụ́ Chineke Izrel ụlọ. 7 Ọ gwara Solomọn nwa ya, sị: “Ọ dị m n’obi ịrụrụ Jehova bụ́ Chineke m ụlọ a ga-anọ na-eto aha ya.+ 8 Ma, Jehova gwara m, sị, ‘I gbuola ọtụtụ mmadụ* n’ọtụtụ agha ị lụrụ. Ị gaghị arụrụ m ụlọ a ga-anọ na-eto aha m,+ n’ihi na i gbuola ọtụtụ mmadụ* n’ụwa. 9 Ị ga-amụ nwa+ ga-abụ onye udo.* M ga-emekwa ka o zuoro ndị iro niile gbara ya gburugburu ike,+ n’ihi na aha ya ga-abụ Solomọn.*+ Ya chịwa, m ga-eme ka ebe niile n’Izrel daa jụụ, udo adịrịkwa na ya.+ 10 Ọ bụ ya ga-arụ ụlọ a ga-anọ na-eto aha m.+ Ọ ga-abụ nwa m, mụnwa ga-abụkwa nna ya.+ M ga-eme ka ocheeze ya sie ezigbo ike ruo mgbe ebighị ebi.’+

11 “Nwa m, ka Jehova nọnyere gị. Ka ị na-arụ ụlọ Jehova bụ́ Chineke gị, ka ihe gaziere gị otú o kwuru banyere gị.+ 12 Ka Jehova mee ka ị dị akọ, na-aghọtakwa ihe+ mgbe ọ ga-eme ka ị na-edu ndị Izrel, ka i nwee ike ịna-edebe iwu Jehova bụ́ Chineke gị.+ 13 Ihe ga-agaziri gị ma i lezie anya na-eme ihe otú Jehova gwara Mosis ka ndị Izrel na-eme,+ na-emekwa ihe ndị o kpebiri.+ Nwee obi ike, dịkwa ike. Atụla egwu, atụkwala ụjọ.+ 14 Agbaala m ezigbo mbọ kpakọta otu narị puku (100,000) talent* ọlaedo na otu nde (1,000,000) talent ọlaọcha maka ụlọ Jehova. E nweghịkwa ike ịtụ ọla kọpa na ígwè+ m kwakọtara atụ̀ n’ihi na ha karịrị akarị. M nwetakwala ọtụtụ osisi na nkume.+ Ma ị ga-etinyekwu ihe na ha. 15 I nwekwara ọtụtụ ndị ọrụ, ma ndị na-awa nkume ma ndị na-edo nkume+ ma ndị ọkwá nkà ma ndị niile nwere nkà n’ụdị ọrụ ọ bụla.+ 16 Ọlaedo, ọlaọcha, ọla kọpa, na ígwè dịnụ karịrị akarị.+ Gaa bido ọrụ, ka Jehova nọnyekwara gị.”+

17 Devid gwaziri ndị isi ndị Izrel niile ka ha nyere Solomọn nwa ya aka. Ọ sịrị: 18 “Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu. O meekwala ka unu zuru ike n’ebe niile unu nọ. N’ihi na o nyefeela ndị bi n’ala a n’aka m. Ha nọzi n’okpuru Jehova na ndị ya. 19 Ugbu a, jirinụ obi unu niile na mkpụrụ obi* unu niile chọọ Jehova bụ́ Chineke unu.+ Rụọkwanụ ụlọ nsọ Jehova bụ́ ezi Chineke,+ ka e wee bubata igbe ọgbụgba ndụ Jehova na arịa ndị dị nsọ e ji ejere ezi Chineke ozi+ n’ụlọ a rụrụ maka ịnọ na-eto aha Jehova.”+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya