Ọrụ Ndịozi
13 E nwere ndị amụma na ndị na-akụzi ihe n’ọgbakọ dị n’Antiọk.+ Ha bụ: Banabas na Simiọn onye aha ya bụkwa Naịja, na Lushiọs onye Saịrini, na Manen onye ya na Herọd onye na-achị ógbè ahụ gụkọrọ akwụkwọ, nakwa Sọl. 2 Ka ha nọ na-ejere Jehova* ozi ma na-ebu ọnụ, Chineke ji mmụọ nsọ ya sị: “Kpọpụtaranụ m Banabas na Sọl+ maka na e nwere ọrụ m kpọrọ ha ka ha rụọ.”+ 3 Mgbe ha buchara ọnụ, kpeekwa ekpere, ha bikwasịrị ha aka n’isi wee sị ha gaa nke ọma.
4 Mmadụ abụọ a Chineke ji mmụọ nsọ ya zipụ gawara Seliushia, sizie ebe ahụ banye ụgbọ mmiri bugara ha Saịprọs. 5 Mgbe ha ruru Salamis, ha malitere ikwusa okwu Chineke n’ụlọ nzukọ ndị Juu. Jọn nọkwa na-ejere ha ozi.*+
6 Mgbe ha gazuru agwaetiti ahụ niile wee ruo Pefọs, ha hụrụ otu nwoke onye Juu, bụ́ dibịa afa. Aha ya bụ Baa-Jizọs. Ọ bụkwa onye amụma ụgha. 7 Ya na onye na-achị ebe ahụ nọ. Aha onye a bụ Sajiọs Pọlọs. Ọ bụ nwoke ma ihe. Nwoke a kpọrọ Banabas na Sọl ka ha bịa na nke ya n’ihi na ọ chọrọ ịnụ okwu Chineke. 8 Ma dibịa afa ahụ, onye a na-akpọkwa Elimas (nke pụtara dibịa afa), malitere inye ha nsogbu, na-achọ ime ka onye ahụ na-achị ebe ahụ ghara ikwere n’Onyenwe anyị. 9 Sọl, onye a na-akpọkwa Pọl, jupụtara na mmụọ nsọ, wee legidesie ya anya ike, 10 sị ya: “Gị onye ụdị aghụghọ ọ bụla na ụdị arụrụala ọ bụla juru n’obi, nwa Ekwensu,+ onye iro nke ihe niile dị mma, gịnị mere i ji akpọdo eziokwu Jehova* isi n’ala? 11 Ugbu a, Jehova* ga-ata gị ahụhụ. Ị ga-ekpu ìsì, ị gaghịkwa ahụ ìhè anyanwụ ruo nwa oge.” N’otu ntabi anya ahụ, alụlụụ na ọchịchịrị kpuchiri ya anya, ya ana-asọ ìsì na-achọ onye ga-ejide ya n’aka na-edu ya. 12 Mgbe onye ahụ na-achị ebe ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ ghọrọ onye na-eso ụzọ Jizọs, n’ihi na ihe ndị ọ nụrụ gbasara Jehova* tụrụ ya n’anya.
13 Pọl na ndị ya na ha so wee banye ụgbọ mmiri na Pefọs, ya ebuga ha Paga nke dị na Pamfilia. Ma Jọn+ hapụrụ ha, laghachi Jeruselem.+ 14 Ma, ha si Paga gaa Antiọk dị na Pisidia. Ha banyekwara n’ụlọ nzukọ+ n’Ụbọchị Izu Ike nọrọ ọdụ. 15 Mgbe a gụpụtachaara ndị mmadụ Iwu Mosis+ na Akwụkwọ Ndị Amụma,* ndị isi oche ụlọ nzukọ ahụ sịrị ha: “Ụmụnna anyị, ọ bụrụ na unu nwere okwu ga-agba anyị ume, kwuwenụ ya.” 16 Pọl wee bilie, feere mmadụ niile aka ka ha nọrọ jụụ. O wee sị:
“Ndị Izrel na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke, geenụ ntị. 17 Chineke ndị Izrel họọrọ nna nna anyị hà, meekwa ka ha bụrụ mba dị ike mgbe ha bụ ndị mbịarambịa n’Ijipt. O jikwa ike ya dị ukwuu* kpọpụta ha n’ala ahụ.+ 18 Ọ nọ na-edi omume ọjọọ ha na-eme n’ala ịkpa ruo ihe dị ka iri afọ anọ.+ 19 Mgbe o bibichara mba asaa n’ala Kenan, o nyere ndị nna nna anyị ala ha.+ 20 Ihe ahụ niile merenụ were ihe dị ka narị afọ anọ na iri ise (450).
“Mgbe ihe ndị a mechara, ọ nọ na-enye ha ndị ikpe ruo n’oge Samuel onye amụma.+ 21 Ha mechara kwuo ka e nye ha eze.+ Chineke wee nye ha Sọl nwa Kish, nwoke si n’ebo Benjamin.+ Ọ chịrị ha afọ iri anọ. 22 Mgbe ọ kwụsịrị ya ịbụ eze, o mere ka Devid bụrụ eze ha.+ O kwuru banyere ya, sị: ‘Ahọrọla m Devid nwa Jesi,+ nwoke obi m nabatara.+ Ọ ga-eme ihe niile m na-achọ.’ 23 Chineke si n’ụmụ* nwoke a wetara Izrel onye nzọpụta bụ́ Jizọs,+ otú o kwere ná nkwa. 24 Tupu Jizọs abịa, Jọn kwusaara ndị Izrel niile na ha kwesịrị ime baptizim iji gosi na ha echegharịala.+ 25 Ma mgbe ọrụ Jọn na-agwụcha, ọ na-adị asị: ‘Ònye ka unu chere na m bụ? Abụghị m onye unu chere na m bụ. Kama, e nwere onye na-abịa n’azụ m, onye m na-erughị eru ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ ya.’+
26 “Ụmụnna m, ndị si n’agbụrụ Ebreham nakwa ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke n’ime unu, ọ bụ anyị niile ka Chineke ziteere ozi gbasara nzọpụta anyị.+ 27 N’ihi na ndị bi na Jeruselem na ndị na-achị ha amaghị onye a. Ma, mgbe ha na-ekpe ya ikpe, ha mezuru ihe Akwụkwọ Ndị Amụma kwuru,+ bụ́ ihe a na-agụpụta kwa ụbọchị izu ike. 28 N’agbanyeghị na ha ahụghị ihe ọ bụla mere a ga-eji gbuo ya,+ ha gwara Paịlet ka e gbuo ya.+ 29 Mgbe ha mezuru ihe niile e dere banyere ya, ha si n’elu osisi budata ya ma lie ya.*+ 30 Ma Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ.+ 31 O gosikwara ndị ya na ha so si Galili gaa Jeruselem onwe ya ruo ọtụtụ ụbọchị. Ọ bụ ndị ahụ na-agbara ndị Juu àmà banyere ya ugbu a.+
32 “N’ihi ya, anyị na-ezi unu ozi ọma banyere nkwa ahụ Chineke kwere nna nna anyị hà. 33 Ọ kpọlitere Jizọs n’ọnwụ,+ si otú ahụ meere anyịnwa, bụ́ ụmụ ha, ihe ahụ niile o kwere ná nkwa, dị ka e dere ya n’abụ ọma nke abụọ, sị: ‘Ị bụ ọkpara m. Abụrụla m nna gị taa.’+ 34 Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ gaghị abụ mmadụ ọzọ, ọ gaghịkwa anwụ anwụ ma ọ bụ ree ure. Chineke gosiri na ihe a bụ eziokwu mgbe ọ sịrị: ‘M gaghị akwụsị ịhụ unu n’anya* otú ahụ m kwere Devid ná nkwa. E kwesịrị ịtụkwasị m obi na m ga-emezu nkwa a.’+ 35 O kwukwara ebe ọzọ n’abụ ọma, sị: ‘Ị gaghị ekwe ka onye jisiri gị aka ike ree ure.’+ 36 Devid mere ihe Chineke chọrọ n’oge nke ya, mechaa nwụọ, e lie ya otú e si lie ndị nna nna ya, ya ereekwa.+ 37 Ma, onye ahụ Chineke kpọlitere n’ọnwụ ereghị ure.+
38 “N’ihi ya, ụmụnna m, ya doo unu anya na ọ bụ naanị Jizọs ka Chineke na-esi n’aka ya agbaghara anyị mmehie. Ọ bụ ihe a ka a na-ekwusara unu.+ 39 Marakwanụ na Iwu Mosis emelighị ka unu bụrụ ndị ezi omume.+ Ma n’ihi ọnwụ nwoke a, Chineke ga-agụ onye ọ bụla kweere na ya n’onye ezi omume.+ 40 N’ihi ya, kpacharanụ anya ka ihe e kwuru n’Akwụkwọ Ndị Amụma ghara ime unu. E kwuru, sị: 41 ‘Unu ndị ọ na-amasị ilelị ihe anya, hụnụ ọrụ m na-arụ n’oge unu. Ọ bụ ọrụ unu na-agaghị ekweta na m rụrụ ọ bụrụgodị na mmadụ akọọrọ unu ya nke ọma. Ma, ọ ga-eju unu anya, unu ga-alakwa n’iyi.’”+
42 Mgbe ha na-apụ, ndị Juu rịọrọ ha ka ha gwakwuo ha ihe ndị a n’Ụbọchị Izu Ike na-abịanụ. 43 Mgbe ndị zukọrọ n’ụlọ nzukọ ahụ gbasara, ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu* sooro Pọl na Banabas. Ha gwara ha okwu, gbaakwa ha ume ka ha ghara ikwe ka amara Chineke kwaa ha.+
44 N’Ụbọchị Izu Ike sochirinụ, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ obodo ahụ niile zukọrọ ka ha nụ okwu Jehova.* 45 Mgbe ndị Juu hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ekworo juru ha obi, ha amalitekwa ịgbagha ihe Pọl na-ekwu, si otú ahụ kwuluo Chineke.+ 46 Pọl na Banabas wee gwa ha n’atụghị egwu, sị: “Ọ dị mma na unu bụ ndị mbụ a gwara okwu Chineke.+ Ma, ebe ọ bụ na unu jụrụ ya, meekwa onwe unu ndị na-erughị eru inweta ndụ ebighị ebi, anyị na-agakwuru ndị mba ọzọ.+ 47 N’ihi na Jehova* gwara anyị, sị: ‘Ahọpụtala m gị ka ị bụụrụ mba dị iche iche ìhè, ka i wee gaa n’ebe niile n’ụwa kwusaa otú m ga-esi azọpụta ndị mmadụ.’”+
48 Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe a, ha malitere ịṅụrị ọṅụ, na-ekwukwa na okwu Jehova* dị ebube. Ndị niile na-akpa àgwà otú na-egosi na ha chọrọ inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. 49 A nọkwa na-agbasa okwu Jehova* ná mba ahụ niile. 50 Ma, ndị Juu mere ka ụmụ nwaanyị a ma ama, ndị bu okpukpe n’isi, na ụmụ nwoke nwere agba n’obodo, megidewe+ Pọl na Banabas. Ha wee mesie ha ike ma chụpụ ha n’obodo ha. 51 Pọl na Banabas wee tichapụrụ ha ájá dị ha n’ụkwụ ma gawa Aịkoniọm.+ 52 Ndị na-eso ụzọ Jizọs wee na-ejupụta na mmụọ nsọ, obi ana-abụkwa ha sọ aṅụrị.+