Rut
4 Boaz gara n’ọnụ ụzọ ámá obodo+ nọdụ ala. Ma, onye kwesịrị ịgbara nwaanyị ahụ, bụ́ onye Boaz kwuru banyere ya,+ na-agafe. Boaz wee sị: “Enyi m, bịa nọdụ ala ebe a.” O wee bịa nọdụ ala. 2 Boaz akpọzie ndị okenye iri n’obodo ahụ+ ma sị ha: “Nọdụnụ ala ebe a.” Ha wee nọdụ ala.
3 Boaz agwazie onye kwesịrị ịgbara nwaanyị ahụ,+ sị: “Naomi, onye si n’ala Moab lọta,+ ga-ere ibé ala nwanne anyị nwoke Elimelek.+ 4 M chere na m kwesịrị ịgwa gị ka ị zụrụ ya n’ihu ndị obodo a na ndị okenye ndị m.+ Ọ bụrụ na ị ga-agbara ya, gbara ya. Ma ọ bụrụ na ị gaghị agbara ya, gwa m ka m mara, n’ihi na ọ bụ gịnwa kwesịrị ịgbara ya. Ọ bụkwa m na-esote gị.” O wee sị: “M ga-agbara ya.”+ 5 Boaz agwazie ya, sị: “Ụbọchị ị ga-azụ Naomi ala ahụ, ọ bụkwa Rut nwaanyị Moab, bụ́ nwunye nwoke ahụ nwụrụ anwụ, ka ị ga-azụ ya, ka ala nwoke ahụ nwụrụ anwụ ghara ịgara ndị ọzọ.”+ 6 Onye ahụ kwesịrị ịgbara nwaanyị ahụ wee sị: “Agaghị m agbarali ya. M gbara ya, ọ ga-aghọ m ahịa. Were ikike m nwere ịgbara ya gbara ya n’ihi na agaghị m agbarali ya.”
7 Ihe ndị Izrel na-eme n’oge ochie mgbe ọ bụla e kwekọrịtara ka mmadụ gbara ihe ma ọ bụ ka o nye onye ọzọ ikike ịgbara ihe bụ na nwoke na-eyipụ akpụkpọ ụkwụ ya+ nye onye nke ọzọ. Ọ bụ otú a ka ndị Izrel si egosi na ha kwekọrịtara n’ihe e kwuru. 8 N’ihi ya, mgbe onye ahụ kwesịrị ịgbara nwaanyị ahụ sịrị Boaz, “Zụrụ ya,” o yipụrụ akpụkpọ ụkwụ ya. 9 Boaz agwazie ndị okenye na mmadụ niile, sị: “Unu bụ ndị akaebe+ taa na m na-azụ Naomi ihe niile bụ́ nke Elimelek nakwa ihe niile bụ́ nke Kilịọn na Malọn. 10 Ana m agbarakwa Rut nwaanyị Moab, bụ́ nwunye Malọn, ka ọ bụrụ nwunye m. Ihe a ga-eme ka ala nwoke ahụ nwụrụ anwụ ghara ịgara ndị ọzọ,+ meekwa ka ụmụnne ya na ndị obodo a ghara ichefu aha ya. Unu bụ ndị akaebe taa.”+
11 Ndị niile nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ na ndị okenye wee sị: “Anyị bụ ndị akaebe. Ka Jehova mee ka nwunye gị nke na-abata n’ụlọ gị dịrị ka Rechel na Lia, bụ́ ndị mụtara mba Izrel.+ Ka ihe gaziere gị n’Efrata,+ ka i nweekwa aha ọma* na Betlehem.+ 12 Ka ụmụ Jehova ga-eme ka nwaanyị a mụtara gị+ mee ka ụlọ gị dị ka ụlọ Pirez,+ onye Tema mụụrụ Juda.”
13 Boaz wee kpọrọ Rut, ya abụrụ nwunye ya. Ya na ya enwee mmekọahụ, Jehova emee ka ọ dịrị ime. O wee mụọ nwa nwoke. 14 Ụmụ nwaanyị wee sị Naomi: “Ka otuto dịrị Jehova, onye na-ekweghị ka ị ghara inwe onye ga-agbara gị taa. Ka a kpọsaa aha nwa a n’Izrel. 15 O* nyeghachila gị ndụ.* Ọ ga-elekwa gị nká, n’ihi na ọ bụ nwunye nwa gị nke hụrụ gị n’anya,+ onye ka ụmụ nwoke asaa mma, mụrụ ya.” 16 Naomi kuuru nwa ahụ kukwasị n’obi ya ma na-elekọta ya.* 17 Ụmụ nwaanyị ndị agbata obi ya wee gụọ nwa ahụ aha. Ha sịrị: “A mụọlara Naomi nwa nwoke.” Ha gụrụ ya Obed.+ Ọ bụ ya mụrụ Jesi,+ nna Devid.
18 Ndị a bụ ndị si n’ezinụlọ Pirez:+ Pirez mụrụ Hezrọn;+ 19 Hezrọn amụọ Ram; Ram amụọ Aminadab;+ 20 Aminadab+ amụọ Nashọn; Nashọn amụọ Salmọn; 21 Salmọn amụọ Boaz; Boaz amụọ Obed; 22 Obed amụọ Jesi;+ Jesi amụọ Devid.+