Ilu
17 Ọ ka mma na mmadụ na-ata ibé achịcha kpọrọ nkụ n’ebe udo dị+
Kama ịnọ na-eri oriri n’ụlọ ebe a na-ese okwu.+
2 Ohu nke na-aghọta ihe ga-achị nwa na-emechu mmadụ ihu.
Ohu ahụ ga-eso ụmụ nna ya ukwu keta akụ̀ ka à ga-asị na ọ bụ nwanne ha.
5 Onye na-akwa ogbenye emo na-akparị Onye kere ya,+
A ga-atakwa onye ọ bụla na-aṅụrị ọṅụ maka ọdachi dakwasịrị onye ọzọ ahụhụ.+
8 Onye na-enye onyinye na-ewere onyinye ya ka nkume dị oké ọnụ.*+
Ebe ọ bụla ọ gara, onyinye ya na-eme ka ihe gaziere ya.+
9 Onye na-agbaghara* ihe ọjọọ e mere ya na-egosi na ọ hụrụ ndị ọzọ
n’anya,+
Ma onye na-ekwukarị gbasara ihe ọjọọ e mere ya na-ekewa ndị bụ́ ezigbo enyi.+
10 Mba a baara onye na-aghọta ihe na-abara ya ezigbo uru+
Karịa ihe a pịara onye iberiibe ugboro otu narị.+
12 Ọ kaara mmadụ mma na ya na anụ ọhịa bea a napụrụ ụmụ ya zutere
Kama ọ ga-ezute onye nzuzu mgbe ọ na-eme iberiibe.+
14 Ịmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere idei mmiri ụzọ.
Tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.+
15 Jehova kpọrọ onye na-ekwu na ikpe amaghị onye ajọ omume asị,+
Kpọọkwa onye na-ekwu na ikpe mara onye ezi omume asị.
17 Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya.+
Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.+
18 Onye na-enweghị uche na-anọ n’ihu onye agbata obi ya kwe nkwa* ma kweta
Na ya ga-ana onye ọzọ n’ibé.+
19 Onye hụrụ esemokwu n’anya hụrụ mmehie n’anya.+
Onye ọ bụla nke na-eme ka ọnụ ụzọ ụlọ ya dị elu ga-ada.+
21 Onye ọ bụla bụ́ nna nwa nzuzu ga na-eru uju.
Nna nwa na-enweghị uche anaghịkwa enwe obi ụtọ.+
28 A ga-eweredị onye nzuzu nke gbachiri nkịtị ka onye ma ihe,
Werekwa onye na-ejide ọnụ ya aka ka onye na-aghọta ihe.