AKỤKỌ NDỤ
Jehova Na-agọzi Ndị Na-eme Uche Ya
E nyere mụ na di m, nwanne m nwoke na nwunye ya ọrụ pụrụ iche. Ozugbo e nyere anyị ya, anyị kwuru, sị: “Anyị ga-arụ ya.” Gịnị mere anyị ji kweta ịrụ ya, oleekwa otú Jehova si gọzie anyị? Ka m buru ụzọ kọọ banyere onwe m.
A MỤRỤ m n’afọ 1923 na Hemswọt. Obodo a dị na Yọkshịa, n’Ingland. Enwere m nwanne nwoke tọrọ m aha ya bụ Bob. Mgbe m dị afọ itoolu, papa anyị nwetara ụfọdụ akwụkwọ gbara okpukpe ụgha n’anwụ. Ihe ọ gụtara na ha tọrọ ya ụtọ n’ihi na soro okwu ọnụ m esola omume m nke ndị isi okpukpe, na-ewe ya iwe. Mgbe afọ ole na ole gachara, otu nwoke aha ya bụ Bob Atkinson bịara n’ụlọ anyị kpọnyere anyị okwu Nwanna Rutherford kwuru e tinyere na gramafon. Anyị ghọtara na ọ bụ ndị dere akwụkwọ ndị ahụ anyị gụrụ kwukwara okwu ndị ahụ anyị gere na gramafon. Papa m na mama m gwara Nwanna Atkinson ka ọ na-abịa n’ụlọ anyị eri nri abalị ka o nwee ike jiri Baịbụl na-aza anyị ọtụtụ ajụjụ ndị anyị nwere. Ọ gwara anyị ka anyị bịa ọmụmụ ihe n’ụlọ otu nwanna ụlọ ya na-adịchaghị anya n’ụlọ anyị. Anyị malitere ịgachi ọmụmụ ihe anya. Obere oge, e hiwe obere ọgbakọ na Hemswọt. Ọ dịghị anya, ndị ohu zoonu amalite ibi na nke anyị. Ihe a na-akpọzi ha ugbu a bụ ndị nlekọta sekit. Anyị na-akpọkwa ndị ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ ndị dị anyị nso ka ha bịa soro anyị rie nri. Amụtara m ọtụtụ ihe n’aka ha.
N’oge ahụ, ezinụlọ anyị malitere ịrụ oche na ire oche. Ma, papa m gwara nwanne m nwoke, sị: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga ebe ọzọ sụwa ụzọ, anyị ga-akwụsị ihe a anyị na-eme.” Bob kwetara ihe papa m kwuru ma gaa biri ebe ọzọ sụwa ụzọ mgbe ọ dị afọ iri abụọ na otu. Mgbe afọ abụọ gachara, aghọrọ m ọsụ ụzọ mgbe m dị afọ iri na isii. Naanị m na-arụkarị n’ozi ọma, e wezụga ná ngwụsị izu. M na-ejikwa kaadị e ji ezi ozi ọma na gramafon ezi ndị mmadụ ozi ọma. Jehova mere ka m nweta onye m na-amụrụ ihe e mechara mee baptizim. Ọtụtụ ndị ezinụlọ ha mechakwara bata n’ọgbakọ. N’afọ ọzọ ya, mụ na Mary Henshall ghọrọ ọsụ ụzọ pụrụ iche. E zigara anyị n’otu obodo dị na Sheshịa, nke na-enweghị ọgbakọ e kenyere ya izi ozi ọma.
N’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, ụmụ nwaanyị na-arụ ọrụ iji kwado agha. Ebe anyị bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, anyị chere na a ga-agụpụ anyị ịga agha otú ahụ a gụpụrụ ndị ozi okpukpe ndị ọzọ. Ma, ụlọikpe emeghị otú ahụ. N’ihi ya, a tụrụ m mkpọrọ abalị iri atọ na otu. N’afọ ọzọ ya, mgbe m dị afọ iri na itoolu, e kpere m ikpe ugboro abụọ n’ụlọikpe, n’ihi na akọnuche m ekweghị m gaa agha. Ma, ugboro abụọ ahụ, ụlọikpe kpelachaara m ikpe. N’oge ihe niile a na-eme, ama m na mmụọ nsọ nọ na-enyere m aka, nakwa na Jehova jidere m aka, na-eme ka m dị ike.—Aịza. 41:10, 13.
OTÚ MỤ NA DI M SI MATA
Mụ na Nwanna Nwaanyị Arthur Matthews matara n’afọ 1946. A tụrụ ya mkpọrọ ọnwa atọ n’ihi na o kweghị aga agha. Obere oge o si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ọ gara ka ya na nwanne ya nwoke aha ya bụ Dennis biri na Hemswọt. Nwanne ya nwoke a bụ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Papa ha malitere mgbe ha bụ nwata kụziwere ha banyere Jehova, e meekwa ha baptizim mgbe ha na-eto eto. Ọ dịghị anya, e ziga Dennis n’Ayaland, ya emee ka Arthur ghara inwe onye ya na ya ga-eso aga ozi ọma. Mgbe papa m na mama m hụrụ otú Dennis si akpa àgwà na otú o si jiri ozi ya kpọrọ ihe, ha kpọọrọ Arthur ka ha na ya biri. Mgbe ọ bụla m gara ụlọ, mụ na Arthur na-asa efere ma anyị richaa nri. Anyị mechakwara detawara ibe anyị akwụkwọ ozi. N’afọ 1948, a tụrụ Arthur mkpọrọ ọnwa atọ ọzọ. Anyị lụrụ n’ọnwa mbụ n’afọ 1949 ma buru n’obi na anyị ga-anọgide n’ozi oge niile otú ike kwere anyị. Anyị na-akpachapụkwa anya n’otú anyị si emefu ego, na-ejikwa oge ezumike atụtụrụ ndị mmadụ mkpụrụ osisi ka anyị nwee ike inweta ego. Jehova gọziri anyị ma mee ka anyị ghara ịkwụsị ịsụ ụzọ.
Mgbe mụ na di m nọ na Hemswọt, obere oge anyị gbachara akwụkwọ n’afọ 1949
Mgbe ihe dị ka otu afọ gachara, e zigara anyị Nọtan Ayaland. Ebe mbụ anyị jere ozi bụ n’Aama, mechaakwa jee ozi na Nuri. Ọtụtụ ndị bi n’obodo ndị a bụ ndị Katọlik. Ha anaghị achọ iji anya ahụ ndị okpukpe ndị ọzọ. N’ihi ya, anyị na-eji akọ ezi ndị mmadụ ozi ọma. Anyị na-anọ n’ụlọ otu nwanna na nwunye ya enwe ọmụmụ ihe. Ọ dị kilomita iri na isii ma e si ebe anyị bi gawa ya. Ihe dị ka mmadụ asatọ na-abịa ọmụmụ ihe. Mgbe ụfọdụ, anyị na-ehi ebe ahụ. Anyị na-ehi n’ala, chi bọọ, anyị erie ezigbo nri ụtụtụ. Obi dị anyị ụtọ na e nweela ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’ebe ndị ahụ.
“ANYỊ GA-ARỤ YA”
Nwanne m nwoke na nwunye ya Lottie bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na Nọtan Ayaland. N’afọ 1952, anyị anọ gara mgbakọ ukwu e nwere na Belfast. Otu nwanna meere anyị ihe ọma nye anyị anọ na Nwanna Pryce Hughes ụlọ n’ụlọ ya. Ọ bụ Nwanna Hughes na-elekọta alaka ụlọ ọrụ Briten n’oge ahụ. E nwere otu abalị anyị nọ na-ekwurịta banyere akwụkwọ ọhụrụ e bipụtara aha ya bụ God’s Way Is Love. Ndị e bu n’obi bipụta ya bụ ndị Ayaland. Nwanna Hughes kwuru na ọ na-esi ike izi ndị Katọlik ozi ọma n’Ayaland. A na-achụpụ ụmụnna n’ebe ha bi. Ndị ụkọchukwu na-agwakwa ndị mmadụ ka ha na-emesi ụmụnna ike. Nwanna Pryce kwuru, sị: “Anyị chọrọ ndị di na nwunye nwere ụgbọala ka ha gaa ebe niile n’Ayaland kesaa akwụkwọ anyị ahụ e bipụtara ọhụrụ.”a Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị kwuru ihe ahụ anyị kwuru ná mmalite, ya bụ, “anyị ga-arụ ya.”
Mgbe mụ na ndị ọsụ ụzọ ndị ọzọ nọ n’ọgba tumtum nwere ebe a na-ebu ndị mmadụ n’akụkụ
Ebe ndị ọsụ ụzọ na-anọkarị na Dọblịn bụ n’ụlọ otu nwanna nwaanyị anyị na-akpọ Mama Rutland. Nwanna nwaanyị a ejeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ. Anyị gara bitụ ebe ahụ ma ree ihe anyị. Mgbe e mechara, Bob buuru anyị anọ n’ọgba tumtum ya nwere ebe a na-ebu ndị mmadụ n’akụkụ ma gawa ịchọ ebe anyị ga-azụta ụgbọala. Anyị chọtara ezigbo ụgbọala mmadụ gbatụrụ ma gwa onye na-ere ya ka o bulaara anyị ya ebe ọ bụ na o nweghị onye n’ime anyị ma otú e si anya ụgbọala. Nwanna Arthur nọ ọdụ n’ihe ndina ná mgbede ahụ niile na-eme ka ọ̀ na-anya ụgbọala. N’ụtụtụ echi ya, mgbe ọ na-achọ isi ebe a dọwara ụgbọala ahụ nyapụta ya n’èzí, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Mildred Willett bịara ebe ahụ. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ. O mechakwara lụọ Nwanna John Barr. Nwanna nwaanyị a ma otú e si anya ụgbọala. Ọ kụzitụụrụ anyị otú e si anya ụgbọala. Anyị eburuzie ụgbọala ahụ gawa.
Ụgbọala anyị nakwa ụgbọala anyị ji mere ụlọ
Ihe ọzọ dị anyị mkpa bụ ụlọ anyị ga-ebi. Ụmụnna dọsiri anyị aka ná ntị ike ka anyị ghara ibi n’ụgbọala e ji mere ụlọ n’ihi na ndị na-achọghị iji anya ahụ anyị nwere ike ịgba ya ọkụ. N’ihi ya, anyị chọrọ ụlọ ebe niile ma anyị ahụghị. N’abalị ahụ, anyị anọ hiri n’ime ụgbọala. N’echi ya, ihe anyị chọtara bụ obere ụgbọala e ji mere ụlọ. O nwere àkwà a rụkwasịrị n’elu àkwà ọzọ. Anyị jizi ya mere ụlọ ma na-adọwa ya n’ala ndị ọrụ ugbo anyị na ha dị ná mma. Anyị na-esi n’ebe ahụ anyị bi ziri ozi ọma gaa kilomita iri na isii ruo iri abụọ na anọ. Ọ na-abụ anyị lọta, anyị ezie ndị bi n’ebe ahụ anyị dọwara ụgbọala, ozi ọma.
Anyị ziri ozi ọma n’ebe niile n’ebe ndịda anyanwụ Ayaland n’enwechaghị onye nyere anyị nsogbu. Anyị nyefere ndị mmadụ akwụkwọ karịrị puku iri abụọ, zigakwara alaka ụlọ ọrụ dị na Briten aha ndị chọrọ ka a bịa mụwara ha Baịbụl. Jehova emeela ka e nwee ọtụtụ narị Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ ugbu a.
ANYỊ LAGHACHIRI ỊNGLAND, MECHAAKWA GAA SKỌTLAND
Mgbe afọ ole na ole gachara, e zigara anyị n’ebe ndịda Lọndọn. Ka izu ole na ole gachara, alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Briten kpọrọ Arthur gwa ya ka ọ malite ọrụ sekit n’echi ya. Mgbe a zụchara ya otu izu, anyị gawara ebe sekit anyị di na Skọtland. N’ihi ya, Arthur enweghị ohere ọ ga-eji kwado ihe omume ya. Ma, ọ dị njikere mgbe niile ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere ya n’ozi Jehova n’agbanyeghị otú o si sie ike. Ihe ndị a ọ nọ na-eme gbara m ezigbo ume. Ọrụ sekit tọgburu anyị atọgbu. Anyị ejeela ozi ọtụtụ afọ n’ebe a na-enweghị ọgbakọ na-eje ozi na ya. Obi dị anyị ụtọ iso ọtụtụ ụmụnna na-eje ozi ugbu a.
N’afọ 1962, a kpọrọ Arthur ka ọ gaa gụọ akwụkwọ ọnwa iri n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. O siiri anyị ike ikpebi ihe anyị ga-eme. Anyị kpebiri ka Arthur gaa, n’agbanyeghị na agaghị m eso aga ebe ọ bụ na a kpọghị m. Ebe ọ bụ na e nweghị onye mụ na ya ga-eso na-aga ozi ọma, alaka ụlọ ọrụ zighachiri m Hemswọt ka m bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe ahụ. Arthur lọtara mgbe otu afọ gachara, a họpụta ya ka ọ bụrụ onye nlekọta distrikti. Anyị jere ozi na Skọtland, ebe ugwu Ịngland, nakwa na Nọtan Ayaland.
E NYERE ANYỊ ỌRỤ ỌHỤRỤ N’AYALAND
N’afọ 1964, e nyere Arthur ọrụ ọhụrụ ka ọ na-elekọta alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Ayaland. Ná mbụ, ụjọ tụrụ m ịga Betel n’ihi na ọrụ sekit na distrikti tọrọ m ụtọ. M cheta ọrụ ndị m rụrụ na Betel kemgbe ahụ, obi na-atọ m ụtọ. M kwetasiri ike na mmadụ rụwa ọrụ e nyere ya n’agbanyeghị na o nwechaghị mmasị ịrụ ya ná mmalite, Jehova ga na-agọzi ya. Na Betel, m rụrụ ọrụ n’ọfịs, ebe a na-etinye akwụkwọ na katọn, ebe a na-esi nri, na idebe ihe ọcha. Anyị rụtụrụ ọrụ distrikti, ya emee ka anyị mata ọtụtụ ụmụnna n’Ayaland. Ịmata ọtụtụ ụmụnna na ịhụ ka ndị anyị na-amụrụ ihe na-eme nke ọma mere ka anyị na ụmụnna dịrịkwuo ná mma n’Ayaland. O doro anya na Jehova gọziri anyị.
IHE ỌMA MEERE NDỊÀMÀ JEHOVA N’AYALAND
N’afọ 1965, e mere mgbakọ mba niile mbụ e nwere n’Ayaland n’obodo Dọblịn.b Mgbakọ a gara nke ọma n’agbanyeghị nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ e nyere anyị. Ndị bịara mgbakọ ahụ dị puku atọ, narị itoolu na iri anọ na asatọ. E mekwara mmadụ iri isii na ise baptizim. Ụmụnna ndị si mba ọzọ bịa dị puku mmadụ atọ na narị ise. Alaka ụlọ ọrụ anyị degaara ndị niile ụmụnna biri n’ụlọ ha akwụkwọ ozi iji kelee ha. Ndị niile ahụ nyere ụmụnna ụlọ toro ụmụnna ndị ahụ maka àgwà ọma ha. N’eziokwu, ihe ọma meere Ndịàmà Jehova n’Ayaland.
Ebe Nwanna Arthur na-ekele Nwanna Nathan Knorr mgbe Nwanna Knorr rutere maka mgbakọ e mere n’afọ 1965
Ebe Arthur na-ewepụta Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible n’asụsụ Gaelic, n’afọ 1983
N’afọ 1966, e jikọtara ebe ugwu na ebe ndịda Ayaland ka ha bụrụ otu. Ọ bụkwa alaka ụlọ ọrụ dị na Dọblịn na-elekọtazi ha. Ị gaghị ahụ ebe e jikọtara ndị mmadụ otú ahụ n’Ayaland n’ihi na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe mere ka ha ghara ịdị n’otu. Obi dị anyị ụtọ ịhụ ka ọtụtụ ndị Katọlik na-abata n’ọgbakọ, soro ụmụnna ha bụbu ndị Protestant na-efe Jehova.
A GBANWERE ỌRỤ ANYỊ
Ndụ anyị gbanwere kpamkpam n’afọ 2011 mgbe e jikọrọ alaka ụlọ ọrụ Briten na alaka ụlọ ọrụ Ayaland ka ha bụrụ otu. E zigara anyị na Betel dị na Lọndọn. N’oge ahụ, m nọ na-echegbu onwe m banyere ọrịa Arthur na-arịa. A chọpụtara na ọ na-arịa ọrịa ọjọọ na-akụrisị ahụ́. N’abalị iri abụọ n’ọnwa ise, afọ 2015, di m mụ na ya jere ozi afọ iri isii, nwụrụ.
Kemgbe afọ ole na ole gara aga, obi na-agbawa m, m na-adakwa mbà n’obi, na-erukwa uju. Mgbe Arthur dị ndụ, ọ naghị eji m egwu egwu. Ọnwụ ya na-ewutekwa m nke ukwuu. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, ọ ga-eme ka ị bịarukwuo Jehova nso. M hụ otú ọtụtụ mmadụ si ekwu okwu ọma banyere Arthur, obi na-atọ m ụtọ. Ndị enyi m nọ n’Ayaland, Briten, nakwa Amerịka edetarala m akwụkwọ ozi. Akwụkwọ ozi ndị ahụ na ume ndị mmadụ gbara m nyeere m ezigbo aka. Ndị so gbaa m ume a bụ nwanne Arthur aha ya bụ Dennis na nwunye ya Mavis, nakwa ụmụ nwanne m nwoke aha ha bụ Ruth na Judy.
Amaokwu na-agba m ezigbo ume bụ Aịzaya 30:18. Ebe ahụ sịrị, “Jehova ga na-atụ anya imere unu amara, n’ihi ya ọ ga-ebili imere unu ebere. N’ihi na Jehova bụ Chineke nke ikpe ziri ezi. Obi ụtọ na-adịrị ndị niile na-atụ anya ya.” Ihe na-akasi m obi bụ na m ma na Jehova ji ndidi na-echere mgbe ọ ga-ewepụrụ anyị nsogbu niile ma nye anyị ọrụ na-atọ ụtọ n’ụwa ọhụrụ ya.
M cheta ozi ndị anyị jeerela Jehova, m na-ahụ otú Jehova si eduzi anyị nakwa otú o si na-agọzi ozi ọma anyị na-ezi n’Ayaland. Obi dị m ụtọ na m so ná ndị nyeere ndị mmadụ aka ha abata n’ọgbakọ. O doro anya na Jehova na-agọzi anyị ma anyị na-eme uche ya.
a Gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 1988, peeji nke 101 ruo 102.
b Gụọ Akwụkwọ Mgbaafọ nke afọ 1988, peeji nke 109 ruo 112.