Ihe Ndị E Nwere Ike Ikwu Mgbe A Na-enyefe Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Nọvemba 1
“Ì chere na ndị mmụọ ozi nwere mmasị n’ihe ndị anyị na-eme? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe Baịbụl kwuru ebe a banyere ndị mmụọ ozi. [Gụọ Luk 15:10.] Isiokwu a kọwara ihe Jizọs kwuru banyere otú ndị mmụọ ozi si enyere anyị aka na otú ndị mmụọ ọjọọ nwere ike isi nweta anyị.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 16.
Teta! Ọktoba–Disemba
“Ụfọdụ ndị chere na Ndịàmà Jehova ekweghị na Jizọs. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa.] Nke bụ eziokwu bụ na Ndịàmà Jehova kweere na Jizọs kwerekwa n’ihe a Baịbụl kwuru banyere Jizọs. [Gụọ Ndị Kọlọsi 1:15.] Ị ga-amata ndị Ndịàmà Jehova bụ nke ọma ma ị gụọ ihe ndị ha kweere, bụ́ nke a kọwara na Teta! a.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 8.
Ụlọ Nche Disemba 1
“Ọtụtụ ndị kweere na e nwere ndị bụ́ mmụọ bụ́ ndị nwere ike imetụta ndụ anyị. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Mkpughe 12:7-9.] Magazin a kọwara ihe Baịbụl kwuru banyere ndị bụ́ mmụọ, nakwa otú ha si emetụta anyị, kọwaakwa ma anyị na ha ò nwere ike imekọ ihe.”
Teta! Ọktoba–Disemba
“Olee ihe i chere banyere fim ndị a na-egosi ndị mmụọ ọjọọ, ndị anwansi, na ndị amoosu? [Chere ka ọ zaa.] Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị iro Chineke nakwa na ‘e debere ha maka ikpe.’ [Gụọ 2 Pita 2:4.] Isiokwu malitere na peeji nke 22 na Teta! a kọwara ihe mere na ọ dịghị mma ka anyị kwe ka ndị mmụọ ọjọọ si na tiivi ma ọ bụ na fim duhie anyị.”