Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Ọgọst
“Ndị mmadụ na-eche na Jizọs ka dị otú ọ dị puku afọ abụọ gara aga. Ụfọdụ na-eche na ọ ka bụ nwa ọhụrụ e nyiwere n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri, ndị ọzọ ana-eche na ọ ka nọ n’osisi ịta ahụhụ. Gịnị ka gịnwa chere? Olee ihe i chere Jizọs na-eme ugbu a? [Chere ka ọ zaa.] Legodị ihe magazin a kwuru.” Nye ya Ụlọ Nche Ọgọst 1, gị na ya tụleekwa ihe e kwuru n’ajụjụ nke mbụ dị na peeji nke 16. Unu gụọkwa ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Akwụkwọ Nsọ dị ebe ahụ. I mechaa, nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ị ga-abịaghachi ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Ọgọst 1
“Ọtụtụ ndị taa kweere n’ọrụ ebube. Ndị ọzọ amaghị ma ihe ndị e kwuru banyere ọrụ ebube hà bụ eziokwu. Gịnị ka gịnwa chere? Ì kweere n’ọrụ ebube? [Chere ka ọ zaa.] E nwere ọrụ ebube a ga-arụ n’ọdịnihu, ọtụtụ ndị na-atụsikwa anya ya ike. [Gụọ otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị dị na peeji nke 9-10.] Ị gụchaa, gị ekwuo, sị, magazin a kwuru ihe atọ ndị mmadụ na-ekwukarị na ọ bụ ha mere ha ekweghị n’ọrụ ebube. O kwukwara ihe mere na ihe ndị ahụ ha na-ekwu abụghị eziokwu.”
Teta! Julaị–Septemba
“Ì chere na ndị nwụrụ anwụ nwere ike inyere ndị dị ndụ aka? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị nwụrụ anwụ. [Gụọ Ekliziastis 9:5] Sapeta peeji nke 10 na magazin ahụ. Kwuzie, sị, e nwee ihe gbagwojuru anyị anya ma ọ bụkwanụ ihe anyị chọrọ ime, ọ kacha mma ka anyị gụọ Okwu Chineke ma mee ihe anyị mụtara na ya.” Nyezie ya magazin ahụ.