Job
15 Elifaz onye Timan wee zaa, sị:
2 “Onye maara ihe ọ̀ ga-eji ihe ọmụma na-enweghị isi na-asa okwu,+
Ka ọ̀ ga-eme ka ime afọ ya jupụta n’ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ?+
3 Ịba naanị mba agaghị aba uru ọ bụla,
Okwu ọnụ efu enweghịkwa uru ọ ga-aba.
4 Otú ọ dị, gị onwe gị na-eme ka ịtụ egwu Chineke ghọọ ihe efu,
Ị na-emekwa ka ịtụgharị uche banyere Chineke ghara inwe ihe ọ bụ.
5 N’ihi na njehie gị na-akụziri ọnụ gị ihe,
Ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka ị họọrọ.
11 Ngụgụ obi Chineke ó zughịrị gị,
Ma ọ bụkwanụ okwu e ji nwayọọ gwa gị?
12 Gịnị mere obi gị ji arafu gị,
Gịnịkwa mere i ji na-achakasị anya?
13 N’ihi na ị na-eme ka mmụọ gị megide Chineke,
I mewokwa ka okwu si n’ọnụ gị na-apụta.
14 Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere ọ ga-eji dị ọcha?+
Ma ọ bụ onye ọ bụla nwaanyị mụrụ nke mere ọ ga-eji bụrụ onye ziri ezi?
16 Ma ya fọdụzie mgbe mmadụ bụ onye a na-asọ oyi, bụrụkwa onye rụrụ arụ,+
Onye na-aṅụ ajọ omume dị ka mmiri!
17 M ga-agwa gị ya. Gee m ntị!+
Ahụwo m nke a, ya mere, ka m kọọ ya,
18 Ya bụ, ihe ndị maara ihe+ na-akọ,
Nke ha na-ezoghịkwa ezo, ebe o si n’ọnụ ndị nna ha.
19 Ọ bụ naanị ha ka e nyere ala,
Ọ dịghị onye bịara abịa nke si n’etiti ha gafere.
20 Onye ajọ omume na-ata ahụhụ ụbọchị ndụ ya niile,
Otú ahụ ka ọ dịkwa ọbụna onye na-achị n’aka ike n’afọ niile dịịrị ya.
23 Ọ na-awagharị na-achọ ihe oriri—ọ̀ dịkwanụ ebee?+
Ọ maara nke ọma na ụbọchị ọchịchịrị+ ga-agbachibido ya dị nso.
25 N’ihi na ọ na-esetị aka ya megide Chineke,
Ọ na-anwakwa igosi na ya ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ike;+
26 N’ihi na o ji ikwesi olu ike na-emegide ya,
Buru ọta dị ikputu;
27 N’ihi na o ji abụba kpuchie ihu ya,
Maakwa abụba n’úkwù ya,+
28 O bi n’obodo ndị a ga-ekpochapụ ekpochapụ;
N’ụlọ ndị mmadụ na-agaghị ebigide na ha,
Bụ́ ndị a kara aka na ha ga-aghọ ikpo nkume.
29 Ọ gaghị aba ọgaranya, akụ̀ ya agaghịkwa amụba,
Ọ gaghịkwa eme ka ihe ndị ha nwetara gbasaa n’elu ụwa.+
30 Ọ gaghị esi n’ọchịchịrị wezụga onwe ya;
Ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ,
Ikuku nke si Chineke n’ọnụ ga-ala ya n’iyi.+
31 Ya atụkwasịla obi n’ihe efu, e wee duhie ya,
N’ihi na ọ bụ naanị ihe efu ka ọ ga-enweta dị ka ụgwọ ọrụ;
33 Dị ka osisi vaịn, mkpụrụ ya na-achaghị acha ga-adapụsị,
Dịkwa ka osisi oliv, ifuru ya ga-adasịsị.