Abụ Solomọn
2 “Abụ m okooko safrọn+ nke puru n’ụsọ oké osimiri,+ bụrụkwa okooko lili nke puru na ndagwurugwu.”+
2 “Dị ka okooko lili nke puru n’etiti ahịhịa ogwu, otú ahụ ka enyi m nwaanyị dị n’etiti ụmụ nwaanyị.”+
3 “Dị ka osisi apụl+ nke dị n’etiti osisi ndị dị n’oké ọhịa, otú ahụ ka onye m hụrụ n’anya dị n’etiti ụmụ nwoke.+ Ndò ya agụsiwo m agụụ ike, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m nọdụrụ ala, mkpụrụ ya na-atọkwa okpo ọnụ m ụtọ. 4 Ọ kpọbatara m n’ụlọ mmanya,+ ọkọlọtọ+ ya nke na-efe n’elu isi m bụ ịhụnanya.+ 5 Nyenụ m achịcha mkpụrụ vaịn+ ka m taa wee nwee ume, nyenụ m mkpụrụ osisi apụl ka m taa; n’ihi na ịhụnanya eriela m obi.+ 6 M hiwere isi n’aka ekpe ya; o jikwa aka nri ya makụọ m.+ 7 Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ejiriwo m nne mgbada+ ma ọ bụ nne ele+ bi n’ọhịa mee ka unu ṅụọ iyi,+ ka unu ghara ịkpọte ịhụnanya dị n’ime m ma ọ bụ kpalie ya ruo mgbe ọ chọrọ.+
8 “Anụrụ m olu onye m hụrụ n’anya!+ Lee! Ọ bụ ya na-abịa,+ ọ na-arị ugwu ukwu, na-awụlikwa elu n’ugwu nta. 9 Onye m hụrụ n’anya yiri nne mgbada+ ma ọ bụ nwa oké ele. Lee! Ọ bụ ya guzo n’azụ mgbidi anyị, si na windo na-elebata anya, sikwa na mpio ụlọ na-enyobata anya.+ 10 Onye m hụrụ n’anya gwara m, sị, ‘Bilie, enyi m nwaanyị, asampete m,+ ka anyị pụọ.+ 11 N’ihi na, lee! oge udu mmiri agafewo,+ oké mmiri ozuzo akwụsịwokwa, ọ laala. 12 Okooko osisi awaala n’elu ala,+ oge e ji akwacha osisi vaịn+ eruwo, a nụwokwa ubé nduru+ n’ala anyị. 13 Osisi fig+ emewo ka mkpụrụ fig mbụ ya chaa;+ osisi vaịn amaala ifuru, ha na-esipụta ísì ụtọ ha. Bilie, bịa, enyi m nwaanyị,+ asampete m, ka anyị pụọ. 14 Nduru m,+ gosi m ihu gị+ n’ebe mgbaba nke dị na nkume dị elu, n’ebe zoro ezo n’ụzọ kpọdara akpọda n’ugwu, ka m nụkwa olu gị, n’ihi na olu gị dị ụtọ, ị makwara mma.’”+
15 “Jiderenụ anyị nkịta ọhịa,+ bụ́ ụmụ nkịta ọhịa na-emebisị ubi vaịn, ebe ọ bụ na ubi vaịn anyị amawo ifuru.”+
16 “Onye m hụrụ n’anya bụ nke m, abụkwa m nke ya.+ Ọ na-azụ atụrụ+ n’ebe okooko lili juru.+ 17 Tupu oge ikuku ji eku eruo, onyinyo alaakwa, tụgharịa, onye m hụrụ n’anya; dịrị ka nne mgbada+ ma ọ bụ nwa oké ele nke nọ n’elu ugwu nkewa.