Ndị Rom
4 Ebe ọ dị otú ahụ, gịnị ka anyị ga-ekwu banyere Ebreham, bụ́ nna nna+ anyị n’anụ ahụ́? 2 Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a kpọrọ Ebreham onye ezi omume n’ihi ọrụ,+ ọ gaara enwe ihe ọ ga-eji na-anya isi; ma ọ bụghị n’ebe Chineke nọ. 3 N’ihi na ọ̀ bụ gịnị ka ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-ekwu? “Ebreham nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, e wee gụọrọ ya nke ahụ dị ka ezi omume.”+ 4 A na-agụ ụgwọ a na-akwụ onye na-arụ ọrụ,+ ọ bụghị dị ka obiọma na-erughịrị ya,+ kama dị ka ụgwọ e ji ya eji.+ 5 N’aka nke ọzọ, onye na-adịghị arụ ọrụ, kama o nwere okwukwe+ n’ebe onye ahụ nọ nke na-akpọ onye na-adịghị asọpụrụ Chineke onye ezi omume, a na-agụ okwukwe ya dị ka ezi omume.+ 6 Dị nnọọ ka Devid kwukwara banyere obi ụtọ nke onye ahụ nwere, bụ́ onye Chineke gụrụ n’onye ezi omume n’abụghị n’ihi ọrụ, sị: 7 “Obi ụtọ na-adịrị ndị a gbaghaara mmebi iwu ha+ na ndị e kpuchiri mmehie ha;+ 8 obi ụtọ na-adịrị onye Jehova na-agaghị agụkọrọ mmehie ya ma ọlị.”+
9 Ya mere, obi ụtọ a ọ̀ na-adịrị ndị e biri úgwù, ka ọ̀ na-adịrị ndị a na-ebighị úgwù?+ N’ihi na anyị na-ekwu, sị: “A gụụrụ Ebreham okwukwe ya dị ka ezi omume.”+ 10 Olee mgbe a gụrụ ya? Ọ bụ mgbe a na-ebibeghị ya úgwù, ka ọ̀ bụ mgbe e biri ya úgwù?+ Ọ bụghị mgbe e biri ya úgwù, kama ọ bụ mgbe a na-ebibeghị ya úgwù. 11 O wee nata ihe ịrịba ama,+ ya bụ, ibi úgwù, dị ka akara nke ezi omume site n’okwukwe o nwere mgbe a na-ebibeghị ya úgwù, ka o wee bụrụ nna+ nke ndị niile nwere okwukwe+ mgbe ha bụ ndị a na-ebibeghị úgwù, ka e wee gụọrọ ha ya dị ka ezi omume; 12 bụrụkwa nna nke ụmụ e biri úgwù, ọ bụghị naanị nke ndị ahụ jidesiri ibi úgwù ike, kamakwa, nke ndị ahụ na-eje ije n’ụzọ kwesịrị ekwesị na nzọụkwụ nke okwukwe ahụ nna+ anyị Ebreham nwere mgbe a na-ebibeghị ya úgwù.
13 N’ihi na ọ bụghị site n’iwu ka e kwere Ebreham ma ọ bụ mkpụrụ ya nkwa+ na e nwere ụwa ọ ga-eketa, kama ọ bụ site n’ezi omume nke si n’okwukwe.+ 14 N’ihi na ọ bụrụ na ndị jidesiri iwu ike bụ ndị nketa, e mewo ka okwukwe bụrụ ihe na-abaghị uru, e wepụwokwa nkwa ahụ.+ 15 N’eziokwu, Iwu ahụ na-eweta ọnụma,+ ma n’ebe iwu na-adịghị, mmebi iwu anaghị adị.+
16 N’ihi ya, ọ bụ n’ihi okwukwe, ka o wee bụrụ dị ka obiọma na-erughịrị mmadụ+ si dị, ka nkwa+ ahụ wee bụụrụ mkpụrụ ya dum ihe e ji n’aka,+ ọ bụghị naanị ndị ahụ jidesiri Iwu ahụ ike, kamakwa ndị ahụ jidesiri okwukwe Ebreham ike. (Ọ bụ nna+ anyị niile, 17 dị nnọọ ka e dere, sị: “Emewo m ka ị bụrụ nna nke ọtụtụ mba.”)+ Ọ bụ n’ihu Onye ahụ nke o nwere okwukwe n’ebe ọ nọ, ya bụ, n’ihu Chineke, bụ́ onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dị ndụ,+ onye na-akpọkwa ihe ndị na-adịghị adị dị ka à ga-asị na ha dị.+ 18 Ọ bụ ezie na olileanya adịkwaghị, ọ dabeere n’olileanya nwee okwukwe,+ ka o wee ghọọ nna nke ọtụtụ mba+ dị ka ihe e kwuru si dị, nke sịrị: “Otú ahụ ka mkpụrụ gị ga-adị.”+ 19 Ọ bụ ezie na ọ daghị mbà n’okwukwe, o chere echiche banyere ahụ́ nke ya, nke nwụrụla anwụ,+ ebe ọ gbara ihe dị ka otu narị afọ,+ nakwa akpa nwa Sera nke nwụworo anwụ.+ 20 Ma n’ihi nkwa ahụ Chineke kwere,+ o nwere okwukwe,+ o nweghịkwa obi abụọ, kama, ọ ghọrọ onye dị ike site n’okwukwe ya,+ wee nye Chineke otuto, 21 kwetakwa n’ụzọ zuru ezu na o nwekwara ike ime ihe o kwere ná nkwa.+ 22 Ya mere, “a gụụrụ ya nke ahụ dị ka ezi omume.”+
23 Otú ọ dị, e dere na “a gụụrụ+ ya nke ahụ,” ọ bụghị naanị n’ihi ya,+ 24 kama, n’ihi anyị bụ́ ndị e kwuru na a ga-agụrụ ya, n’ihi na anyị kwere n’onye ahụ nke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Jizọs Onyenwe anyị.+ 25 E nyefere ya n’ihi njehie anyị,+ a kpọlitekwara ya ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume.+