7 Lee, anyị nọ na-eke ọka* n’ùkwù n’ùkwù n’etiti ubi mgbe ùkwù ọka m biliri guzo ọtọ, ma, lee, ùkwù ọka unu gbara ùkwù ọka m gburugburu ma kpọọrọ ya isiala.”+
6 O wee gaa n’ihu ịsị: “Biko, nụrụnụ okwu m. Ọ bụrụ na unu enwee onye amụma nke ga na-eburu Jehova amụma, ọ bụ n’ọhụụ+ ka m ga-eme ka ọ mara m. Ná nrọ+ ka m ga-agwa ya okwu.