22 Ha wee gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala wee sị: “Biko, Chineke, Chineke nke mmụọ nke ụdị anụ ahụ́ ọ bụla,+ naanị otu onye ọ̀ ga-emehie, i wee weso nzukọ a dum iwe?”+
5 Otú ọ dị, ọ bụrụ na ajọ omume anyị emee ka ezi omume nke Chineke+ pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Chineke ọ̀ na-ekpe ikpe na-ezighị ezi+ mgbe ọ na-egosi ọnụma ya? (Ana m ekwu dị ka mmadụ.+)