Abụ Ọma 34:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Anya Jehova dị n’ebe ndị ezi omume nọ,+Ntị ya dịkwa ná mkpu enyemaka ha na-eti.+ Abụ Ọma 65:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.+ Aịzaya 58:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Mgbe ahụ ka ị ga-akpọku Jehova, ya aza; ị ga-eti mkpu enyemaka,+ ya asịkwa, ‘Lee m!’ “Ọ bụrụ na i wepụ osisi yok n’ebe ị nọ,+ kwụsị ịtụ aka+ na ikwu okwu ọjọọ;+ Aịzaya 65:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Ọ ga-erukwa na tupu ha akpọkuo m, m ga-aza ha;+ mgbe ha ka kpụ okwu n’ọnụ, mụ onwe m ga-anụ ya.+ 1 Jọn 5:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ+ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.+
9 Mgbe ahụ ka ị ga-akpọku Jehova, ya aza; ị ga-eti mkpu enyemaka,+ ya asịkwa, ‘Lee m!’ “Ọ bụrụ na i wepụ osisi yok n’ebe ị nọ,+ kwụsị ịtụ aka+ na ikwu okwu ọjọọ;+
14 Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ+ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.+