30 Ma Saịhọn eze Heshbọn ekweghị ka anyị si n’ala ya gafere, n’ihi na Jehova bụ́ Chineke gị kwere ka mmụọ ya sie ike+ nakwa ka obi kpọọ ya nkụ, ka o wee nyefee ya n’aka gị dị nnọọ ka ọ dị taa.+
20 N’ihi na ihe Jehova mere ha bụ ikwe ka obi ha kpọchie+ ka ha buso Izrel agha, ka o wee bibie ha, ka a ghara imere ha ebere,+ kama ka ọ laa ha n’iyi, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.+
6 Gịnị mere unu ga-eji kpọchie obi unu dị nnọọ ka ndị Ijipt na Fero kpọchiri obi ha?+ Ọ́ bụghị ngwa ngwa o mesichara ha ike+ ka ha hapụrụ ha, ha wee lawa?+