Diuterọnọmi 28:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 “Jehova ga-eme ka e merie ndị iro gị n’ihu gị, bụ́ ndị na-ebuso gị agha.+ Ha ga-esi n’otu ụzọ pụta ibuso gị agha, ma ha ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu gị.+ Diuterọnọmi 32:30 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 30 Olee otú otu onye pụrụ isi chụọ otu puku mmadụ ọsọ,Mmadụ abụọ achụọkwa puku mmadụ iri ọsọ?+Ọ gwụla ma Oké Nkume ha ò rere ha,+Jehova enyefeekwa ha n’aka ha. Joshụa 23:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Naanị otu onye n’etiti unu ga-achụ otu puku mmadụ ọsọ,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-eburu unu agha,+ dị nnọọ ka o kwere unu ná nkwa.+ Ndị Ikpe 7:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 O wee kee narị ndị ikom atọ ahụ ụzọ atọ, nye ha niile opi+ na nnukwu ite ihe na-adịghị, nakwa ọwa ọkụ ndị e tinyere n’ime nnukwu ite ndị ahụ. Ndị Ikpe 15:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 O wee hụ ọkpụkpụ agba oké ịnyịnya ibu nke na-akpọbeghị nkụ, wee matịa aka were ya kụgbuo otu puku ndị ikom.+ 1 Ihe E Mere 11:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Ma Abishaị+ nwanne Joab+ ghọrọ onyeisi mmadụ atọ ahụ; o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ, aha ya na-edekwa ude dị ka nke mmadụ atọ ahụ.
7 “Jehova ga-eme ka e merie ndị iro gị n’ihu gị, bụ́ ndị na-ebuso gị agha.+ Ha ga-esi n’otu ụzọ pụta ibuso gị agha, ma ha ga-esi n’ụzọ asaa gbapụ n’ihu gị.+
30 Olee otú otu onye pụrụ isi chụọ otu puku mmadụ ọsọ,Mmadụ abụọ achụọkwa puku mmadụ iri ọsọ?+Ọ gwụla ma Oké Nkume ha ò rere ha,+Jehova enyefeekwa ha n’aka ha.
10 Naanị otu onye n’etiti unu ga-achụ otu puku mmadụ ọsọ,+ n’ihi na ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu na-eburu unu agha,+ dị nnọọ ka o kwere unu ná nkwa.+
16 O wee kee narị ndị ikom atọ ahụ ụzọ atọ, nye ha niile opi+ na nnukwu ite ihe na-adịghị, nakwa ọwa ọkụ ndị e tinyere n’ime nnukwu ite ndị ahụ.
15 O wee hụ ọkpụkpụ agba oké ịnyịnya ibu nke na-akpọbeghị nkụ, wee matịa aka were ya kụgbuo otu puku ndị ikom.+
20 Ma Abishaị+ nwanne Joab+ ghọrọ onyeisi mmadụ atọ ahụ; o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ, aha ya na-edekwa ude dị ka nke mmadụ atọ ahụ.