Diuterọnọmi 32:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Ike ga-agwụ ha n’ihi agụụ,+ oké ahụ́ ọkụ ga-eripịakwa ha,+Ya na ajọ mbibi.+M ga-ezitekwa anụ ọhịa ka ha taa ha,+Ha na anụ ndị na-akpụ n’ala ka ha tanye ha elò n’ahụ́.+ 2 Ndị Eze 17:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 O wee ruo na mgbe ha malitere ibi n’ebe ahụ, ha atụghị egwu+ Jehova. N’ihi ya, Jehova zigara ọdụm+ n’etiti ha, ha wee na-adọgbu ụfọdụ n’ime ha. Jeremaya 15:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 “‘M ga-enyefekwa ha n’aka ụzọ ihe anọ,’+ ka Jehova kwuru, ‘ka mma agha gbuo ha, ka nkịta dọkpụrụ ha, ka anụ ufe nke eluigwe+ na anụ ọhịa nke ụwa rie ha ma laa ha n’iyi.
24 Ike ga-agwụ ha n’ihi agụụ,+ oké ahụ́ ọkụ ga-eripịakwa ha,+Ya na ajọ mbibi.+M ga-ezitekwa anụ ọhịa ka ha taa ha,+Ha na anụ ndị na-akpụ n’ala ka ha tanye ha elò n’ahụ́.+
25 O wee ruo na mgbe ha malitere ibi n’ebe ahụ, ha atụghị egwu+ Jehova. N’ihi ya, Jehova zigara ọdụm+ n’etiti ha, ha wee na-adọgbu ụfọdụ n’ime ha.
3 “‘M ga-enyefekwa ha n’aka ụzọ ihe anọ,’+ ka Jehova kwuru, ‘ka mma agha gbuo ha, ka nkịta dọkpụrụ ha, ka anụ ufe nke eluigwe+ na anụ ọhịa nke ụwa rie ha ma laa ha n’iyi.