22 M ga-eme ka anụ ọhịa bata n’etiti unu,+ ha ga-agbawa unu aka ụmụ+ ma gbuchapụ anụ ụlọ unu, meekwa ka ọnụ ọgụgụ unu belata, ụzọ unu ga-atọgbọkwa chakoo.+
3 “‘M ga-enyefekwa ha n’aka ụzọ ihe anọ,’+ ka Jehova kwuru, ‘ka mma agha gbuo ha, ka nkịta dọkpụrụ ha, ka anụ ufe nke eluigwe+ na anụ ọhịa nke ụwa rie ha ma laa ha n’iyi.
17 M ga-ezipụ ụnwụ na ajọ anụ ọhịa ka ha bịakwasị unu.+ Ha ga-emekwa ka ị gbara aka nwa. Ọrịa na-efe efe+ na ọbara+ ga-esikwa n’etiti gị gafee, m ga-emekwa ka mma agha bịakwasị gị.+ Mụ onwe m, Jehova, ekwuwo ya.’”