Jenesis 35:22 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 22 O wee ruo mgbe Izrel bi n’ụlọikwuu+ n’ala ahụ na Ruben gara otu mgbe dinaa Bilha iko nna ya, Izrel wee nụ ya.+ Ụmụ ndị ikom Jekọb dị mmadụ iri na abụọ. Levitikọs 20:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Nwoke ya na nwunye nna ya dinara ekpughewo ọtọ nna ya.+ A ghaghị igbu ha abụọ. Ọbara ha ga-adị ha n’isi. Diuterọnọmi 22:30 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 30 “Ọ dịghị onye kwesịrị ịkpọrọ nwunye nna ya, ka o wee ghara ikpuli uwe mwụda nna ya.+ Diuterọnọmi 27:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke dinara nwunye nna ya, n’ihi na o kpuliwo uwe mwụda nna ya.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’) 2 Samuel 16:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Ahitofel wee sị Absalọm: “Dinaa ndị iko nna gị,+ bụ́ ndị ọ hapụrụ ka ha lekọtawa ụlọ.+ Izrel dum ga-anụkwa na i mewo onwe gị ka ị na-esi ísì ọjọọ+ n’ebe nna gị nọ,+ aka+ ndị niile dịnyeere gị ga-adịkwa ike.” 1 Ndị Kọrịnt 5:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 N’ezie, a na-akọ na ịkwa iko+ dị n’etiti unu, bụ́ ụdị ịkwa iko nke na-adịghị ọbụna n’etiti ndị mba ọzọ, na otu nwoke kpọọrọ nwunye nna ya.+
22 O wee ruo mgbe Izrel bi n’ụlọikwuu+ n’ala ahụ na Ruben gara otu mgbe dinaa Bilha iko nna ya, Izrel wee nụ ya.+ Ụmụ ndị ikom Jekọb dị mmadụ iri na abụọ.
11 Nwoke ya na nwunye nna ya dinara ekpughewo ọtọ nna ya.+ A ghaghị igbu ha abụọ. Ọbara ha ga-adị ha n’isi.
20 “‘Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke dinara nwunye nna ya, n’ihi na o kpuliwo uwe mwụda nna ya.’+ (Mmadụ niile ga-asị, ‘Amen!’)
21 Ahitofel wee sị Absalọm: “Dinaa ndị iko nna gị,+ bụ́ ndị ọ hapụrụ ka ha lekọtawa ụlọ.+ Izrel dum ga-anụkwa na i mewo onwe gị ka ị na-esi ísì ọjọọ+ n’ebe nna gị nọ,+ aka+ ndị niile dịnyeere gị ga-adịkwa ike.”
5 N’ezie, a na-akọ na ịkwa iko+ dị n’etiti unu, bụ́ ụdị ịkwa iko nke na-adịghị ọbụna n’etiti ndị mba ọzọ, na otu nwoke kpọọrọ nwunye nna ya.+