Abụ Ọma 141:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ ga-abụ obiọma;*+Ọ bụrụkwa na ọ baara m mba, ọ ga-abụ mmanụ a wụsara m n’isi,+Nke isi m na-agaghị achọ ịjụ.+N’ihi na m ka ga na-ekpere ha ekpere ọbụna n’oge ọdachi dakwasịrị ha.+ Ilu 9:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Abarala onye na-akwa emo mba, ka ọ ghara ịkpọ gị asị.+ Baara onye maara ihe mba, ọ ga-ahụ gị n’anya.+ Matiu 18:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 “Ọ bụrụkwa na nwanna gị emehie, gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ n’ebe naanị gị na ya nọ.+ Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritewo nwanna gị n’uru.+ Ndị Galeshia 2:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Otú ọ dị, mgbe Sifas+ bịara Antiọk,+ agwara m ya okwu ihu na ihu, n’ihi na ihe o mere kwesịrị nkatọ.+ 1 Timoti 5:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Na-adọ ndị na-eme mmehie+ aka ná ntị+ n’ihu mmadụ niile, ka ndị ọzọ wee tụọkwa egwu.+ Taịtọs 1:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Àmà nke a bụ eziokwu. Na-adọsi ha aka ná ntị ike+ n’ihi ihe a, ka ha wee nọgidesie ike+ n’okwukwe,
5 Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ ga-abụ obiọma;*+Ọ bụrụkwa na ọ baara m mba, ọ ga-abụ mmanụ a wụsara m n’isi,+Nke isi m na-agaghị achọ ịjụ.+N’ihi na m ka ga na-ekpere ha ekpere ọbụna n’oge ọdachi dakwasịrị ha.+
8 Abarala onye na-akwa emo mba, ka ọ ghara ịkpọ gị asị.+ Baara onye maara ihe mba, ọ ga-ahụ gị n’anya.+
15 “Ọ bụrụkwa na nwanna gị emehie, gaa mee ka ọ mara ebe o mejọrọ n’ebe naanị gị na ya nọ.+ Ọ bụrụ na o gee gị ntị, i ritewo nwanna gị n’uru.+
11 Otú ọ dị, mgbe Sifas+ bịara Antiọk,+ agwara m ya okwu ihu na ihu, n’ihi na ihe o mere kwesịrị nkatọ.+
13 Àmà nke a bụ eziokwu. Na-adọsi ha aka ná ntị ike+ n’ihi ihe a, ka ha wee nọgidesie ike+ n’okwukwe,