16 N’ihi na ị bụ Nna anyị;+ ọ bụ ezie na o nwere ike ịbụ na Ebreham amaghị anyị, o nwekwara ike ịbụ na Izrel amaghị anyị, gị onwe gị, Jehova, bụ Nna anyị. Onye Mgbapụta anyị kemgbe oge dị anya gara aga bụ aha gị.+
19 Mụ onwe m asịwo, ‘Lee otú m si kpọbata gị n’etiti ụmụ m wee nye gị ala ahụ dị mma,+ bụ́ ihe nketa mara mma n’anya ìgwè mba dị iche iche!’ M wee kwuokwa, sị, ‘Unu ga-akpọ m “Nna m!”+ unu agaghịkwa akwụsị iso m.’
6 n’ebe anyị nọ, otu Chineke dị,+ bụ́ Nna,+ onye ihe niile si n’aka ya dịrị, anyị onwe anyị dịkwaara ya;+ otu Onyenwe anyị dịkwa,+ bụ́ Jizọs Kraịst,+ onye e si n’aka ya mee ka ihe niile dịrị,+ anyị onwe anyị sikwa n’aka ya.