12 “Ma ọ bụrụ na unu anwaa anwaa laghachi azụ,+ unu ewee rapara n’ahụ́ ndị fọdụrụ ná mba ndị a,+ bụ́ ndị a fọdụrụ n’etiti unu, unu na ha ewee na-agọ ọgọ,+ unu na ha ana-akpakọrịtakwa,
2 O wee gakwuru Esa sị ya: “Geenụ m ntị, Esa na Juda na Benjamin dum! Jehova ga-anọnyere unu ma ọ bụrụhaala na unu adịnyere ya;+ ọ bụrụ na unu achọọ+ ya, ọ ga-ekwe ka unu chọta ya, ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.+
22 N’ihi na ihere mere m ịrịọ eze ka o nye anyị ndị agha+ na ndị na-agba ịnyịnya+ iji nyere anyị aka ibuso ndị iro agha n’ụzọ, n’ihi na anyị gwara eze, sị: “Aka+ Chineke anyị na-echebe ndị niile na-achọ ya imere ha ihe ọma,+ ma ike ya na iwe+ ya na-emegide ndị niile na-ahapụ ya.”+
13 Jehova, olileanya Izrel,+ ihere ga-eme ndị niile hapụrụ gị.+ Ndị si n’ife m ofufe dapụ,+ a ga-ede aha ha n’ájá, n’ihi na ha ahapụwo isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, bụ́ Jehova.+