24 Otú ọ dị, mgbe ihe dị ka ọnwa atọ gasịrị, a kọọrọ Juda, sị: “Tema nwunye nwa gị agbawo akwụna,+ lee, ọ tụrụwokwa ime+ site n’akwụna ọ gbara.” Juda wee sị: “Kpọpụtanụ ya ka a kpọọ ya ọkụ.”+
14 “‘Ọ bụrụ na nwoke alụọ nwaanyị, ya na nne nwunye ya enwee mmekọahụ, ọ bụ omume rụrụ arụ.+ A ga-akpọ ya na ha ọkụ,+ ka omume rụrụ arụ+ ghara ịdịgide n’etiti unu.
15 Ọ ga-erukwa na a ga-agba onye ọ bụla a họọrọ nke ji ihe ahụ a ga-ebibi ebibi ọkụ,+ ya na ndị niile bụ́ nke ya, n’ihi na o mebiwo ọgbụgba ndụ+ Jehova nakwa n’ihi na o mewo ihe nzuzu na-eweta ihere n’Izrel.”’”+