14 Otú ahụ ka Ebram si nụ na a dọọrọ nwanne ya n’agha.+ O wee kpọkọta ndị ikom ya e nyere ọzụzụ,+ bụ́ narị ndị ohu atọ na iri na asatọ a mụrụ n’ezinụlọ ya,+ o wee chụrụ ha ruo Dan.+
47 Ókèala ụmụ Dan abaghị ha.+ Ụmụ Dan wee gbagoo buso Lishem agha,+ weghara ya ma jiri ihu mma agha bibie ya. Ha wee nweta ya ma biri na ya. Ha wee gụọ Lishem Dan, bụ́ aha Dan nna nna ha.+
11 Mụ onwe m na-adụ ọdụ, sị: Ka a hụ na a kpọkọtaara gị Izrel dum, malite na Dan ruo Bia-shiba,+ ha ga-adịkwa ọtụtụ dị ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri,+ gị onwe gị ga-esokwa gaa agha ahụ.+