18 Mgbe Jehova nyekwara ha onyeikpe,+ Jehova na-anọnyere onyeikpe ahụ, ọ na-azọpụtakwa ha n’aka ndị iro ha n’ụbọchị niile nke onyeikpe ahụ; n’ihi na ọ na-ewute Jehova+ na ha na-asụ ude n’ihi ndị na-emegbu ha+ na ndị na-akwagharị ha.
10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike.+ M ga-enyere gị aka.+ M ga-eji aka nri m+ nke ezi omume+ jidesie gị ike.’