4 Ma Jọnatan,+ nwa Sọl, nwere nwa nwoke dara ngwọrọ.+ Afọ ise ka ọ gbara mgbe e si na Jezril+ zite ozi banyere Sọl na Jọnatan; onye na-elekọta ya wee kuru ya gbawa ọsọ, ma ka o ji ụjọ na-agba ọsọ, nwata ahụ dara wee daa ngwọrọ. Aha ya bụ Mefiboshet.+