23 Ma Ahitofel hụrụ na e meghị ihe ọ dụrụ n’ọdụ,+ o wee dokwasị ihe o ji anọkwasị n’ịnyịnya ibu wee bilie laa n’ụlọ ya, n’obodo ya.+ O wee nye ezinụlọ ya iwu+ ma kwụgbuo+ onwe ya, o wee si otú a nwụọ.+ E wee lie+ ya n’ebe ili ozu nke nna nna ya hà.
18 O wee ruo na ozugbo Zimraị hụrụ na e wegharawo obodo ahụ, ọ banyere n’ụlọ obibi dị elu nke ụlọ eze wee gbaa ụlọ eze ọkụ gbakọta onwe ya, o wee nwụọ,+
4 Sọl wee sị onye na-eburu ya ihe agha:+ “Mịrị mma agha+ gị maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù+ ghara ịbịa mee m ihe na-adịghị mma.”+ Ma onye na-eburu ya ihe agha ekweghị,+ n’ihi na egwu ji ya nke ukwuu. Sọl wee mịrị mma agha ya wee dakwasị na ya.+