28 “‘Ma, ọ dịghị ụdị ihe ọ bụla a raara nye bụ́ ihe mmadụ raara nye Jehova maka mbibi+ n’ime ihe niile bụ́ nke ya, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ ma ọ̀ bụ ala ubi nke bụ́ ihe nketa ya, a ga-ere ere, ọ dịghịkwa ụdị ihe ọ bụla a raara nye a ga-agbara agbara.+ Ọ bụ ihe kasị nsọ nye Jehova.