25 Ị ga-akpọ ihe oyiyi a pịrị apị nke chi ha ọkụ.+ Ka agụụ ọlaọcha na ọlaedo dị na ha ghara ịgụ gị,+ ewerekwala ya,+ ka ọ ghara ịmata gị n’ọnyà;+ n’ihi na ọ bụ ihe arụ+ n’anya Jehova bụ́ Chineke gị.
26 Ewebatala ihe arụ n’ụlọ gị, i wee ghọọ ihe a ga-ebibi ebibi dị ka ya. Ị ga-asọ ya oyi nke ukwuu ma kpọ ya ajọ asị,+ n’ihi na ọ bụ ihe a ga-ebibi ebibi.+
17 Obodo a ga-abụkwa ihe a ga-ebibi ebibi;+ ya na ihe niile dị n’ime ya bụ nke Jehova. Naanị Rehab+ nwaanyị akwụna ahụ ga-adị ndụ, ya na ndị niile ya na ha nọ n’ụlọ, n’ihi na o zoro ndị ozi ahụ anyị zipụrụ.+
7Ụmụ Izrel wee mee omume ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihe banyere ihe a ga-ebibi ebibi, n’ihi na Ekan+ nwa Kamaị, nwa Zabdaị, nwa Zira, nke ebo Juda, weere ụfọdụ n’ime ihe a ga-ebibi ebibi.+ Jehova wee weso ụmụ Izrel iwe dị ọkụ.+
3 Gaa gbuo ndị Amalek+ ma laa ha na ihe niile ha nwere n’iyi,+ enwekwarala ha ọmịiko, gbuo ha,+ ma nwoke ma nwaanyị, ma nwatakịrị ma nwa na-aṅụ ara,+ ma ehi ma atụrụ, ma kamel ma ịnyịnya ibu.’”+