Job 14:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol,+Na ị ga-ezobe m ruo mgbe iwe gị dajụrụ,Na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru,+ i wee cheta m!+ Abụ Ọma 30:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Jehova, i mewo ka mkpụrụ obi m si na Shiol pụta;+I debewo m ndụ, ka m wee ghara ịgbada n’olulu.+ Abụ Ọma 49:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Otú ọ dị, Chineke ga-anapụta mkpụrụ obi m n’aka Shiol,+N’ihi na Ọ ga-anabata m. Sila. Abụ Ọma 86:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 N’ihi na obiọma ị na-egosi m dị ukwuu,+Ị napụtawokwa mkpụrụ obi m na Shiol, bụ́ ebe dị n’ime ime ala.+ Jọn 11:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Mata wee sị ya: “Amaara m na ọ ga-ebili n’oge mbilite n’ọnwụ+ n’ụbọchị ikpeazụ.” 1 Ndị Kọrịnt 15:55 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 55 “Ọnwụ, olee mmeri gị? Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?”+
13 A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol,+Na ị ga-ezobe m ruo mgbe iwe gị dajụrụ,Na ị ga-ekpebi oge m ga-anọru,+ i wee cheta m!+
13 N’ihi na obiọma ị na-egosi m dị ukwuu,+Ị napụtawokwa mkpụrụ obi m na Shiol, bụ́ ebe dị n’ime ime ala.+