36 Lee! Ụmụ ha abụọ, Ahimaz+ nwa Zedọk na Jọnatan+ nwa Abayata sokwa ha nọrọ n’ebe ahụ; ọ bụkwa ha ka unu ga-ezi ihe ọ bụla unu ga-anụta ka ha bịa zie m.”
17 Ka Jọnatan+ na Ahimaz+ guzo n’En-rogel,+ otu nwaanyị na-eje ozi gara kọọrọ ha. Ha wee pụwa, ebe ọ bụ na ha aghaghị ịkọrọ Eze Devid; n’ihi na ha agaghị anwa anwa mee ka a hụ ha mgbe ha na-abanye n’obodo.