18 Ọ ga-erukwa na onye ọ bụla nke na-agbanahụ ụda nke ihe ọ na-atụ ụjọ ya ga-adaba n’olulu, onye ọ bụla nke sikwa n’olulu na-arịgota, ọnyà ga-ama ya.+ N’ihi na a ga-emeghe ọnụ ụzọ mmiri nke dị n’elu,+ ntọala niile nke ala a ga-amakwa jijiji.+
14 Onye nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwe ebe ọ ga-agbaba.+ Ọ dịghị onye dị ike nke ga-eme onwe ya ka ọ dịkwuo ike, ọ dịghịkwa dike nke ga-emere mkpụrụ obi ya ụzọ mgbapụ.+
3 Ọ bụrụ na ha ezoo n’elu ugwu Kamel, m ga-achọ ha nke ọma n’ebe ahụ. M ga-ejiderịrị ha.+ Ọ bụrụkwa na ha ezoo n’ala ala oké osimiri+ ka m ghara ịhụ ha, m ga-enye agwọ iwu ka ọ taa ha n’ebe ahụ.