16 Manase wụfukwara ọbara na-emeghị ihe ọjọọ+ n’ebe ọ dị nnọọ ukwuu, ruo mgbe o mere ka Jeruselem ju n’ọnụ malite n’otu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, n’agụnyeghị mmehie ya nke o ji mee ka Juda mehie site n’ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+
11 N’ikpeazụ, Jehova mere ka ndị isi agha nke eze Asiria+ buso ha agha.+ Ha wee nwụde Manase n’ọgba+ wee tụọ ya ịgà+ abụọ e ji ọla kọpa mee ma kpụga ya Babịlọn.
13 O wee na-ekpeku ya ekpere, nke mere na ọ nabatara+ arịrịọ ya. O wee nụ arịrịọ ọ na-arịọ ka e meere ya amara. O wee mee ka ọ lọghachi Jeruselem, n’ọchịchị ya;+ Manase wee mara na Jehova bụ ezi Chineke.+