17 O wee mee ka eze ndị Kaldia buso ha agha,+ eze ahụ wee jiri mma agha gbuo ụmụ okorobịa ha+ n’ime ụlọ nsọ ha,+ o nweghịkwara nwa okorobịa ma ọ bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, okenye ma ọ bụ agadi ume na-adịkwaghị ọmịiko.+ O nyefere ihe niile n’aka ya.
2 “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Gaa gwa Zedekaya eze Juda,+ ee, sị ya: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-enyefe obodo a n’aka eze Babịlọn,+ ọ ga-agbakwa ya ọkụ.+