2 Ha ga-agbasa ha n’okpuru anyanwụ na ọnwa na ìgwè ihe niile dị n’eluigwe bụ́ ndị ha hụrụ n’anya, feekwa ofufe, jesookwa,+ chọọkwa ma kpọọrọ isiala.+ A gaghị achịkọta ha, a gaghịkwa eli ha eli. Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.”+
4 ‘Ọrịa dị iche iche ga-egbu ha.+ A gaghị akwara ha ákwá arịrị,+ a gaghịkwa eli ha eli.+ Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala;+ mma agha na ụnwụ ga-ala ha n’iyi,+ ozu ha ga-abụrụ anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa ihe oriri.’+